DI na nwunye ndị China a tọọrọ nwa ha nwoke n’afọ 1988 ezutela ya n’ọnụ ka ọ gachara afọ iri atọ na abụọ.
Mao Yin onye a tọọrọ mgbe ọ gbara afọ abụọ ka nna ya kwụsịrị ụgbọala ka onye ya mmiri ka ọ na-ebulata ya site n’ụlọakwụkwọ ọtaakara (nursery school).
Nne na nna ya chọrọ ya mba China niile, ebe nne ya kere mpempe akwụkwọ (flyers) karịrị otu narị puku (100,000).
A mụrụ Mao Yin ka ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri abụọ na atọ n’afọ 1986. Ka ọnwa Oktoba dị n’abalị iri na asaa n’afọ 1988 ebe nna ya bụ Mao Zhenjng na-akpọlata ya n’ụlọakwụkwọ ebe ọ nọ ọtaakara na Xian nke dị na Shaanxi; nwata ahụ kwuru na ọ chọrọ ịńụ mmiri nke mere ka nna ya kwụsị ụgbọala n’ihu otu ụlọ oriri na ọńụńụ. Ka nna ya chọrọ ka o mee mmiri ọkụ ha ji ka ọ jụọ oyi, n’otu ntabi anya a tọrọ nwata ahụ.
Ezinaụlọ ahụ, Mao Jingzhi na nwunye ya Li Jingzhi gbara mbọ elu na ala ma ekwe akụtaghị onye ala ji. Mana nke ahụ emeghị ka ike gwụ ha ịchọ nwa ha. Ha chọgidere ya ganye na ha ahụ ya.
N’ọnwa April afọ a, ndị uweojii nwetara ozi (tip) gbasra otu nwoke onye Sichuan nke dị na South-West China, bụ onye kpọtara nwa dịka nke ya (adoption) ọtụtụ afọ gara aga.
Ndị uweojii chọtara nwa ahụ ọ kpọtara dịka nke ya, onye nke dịzi afọ iri atọ na anọ ugbu a. E mere nnyocha nke e ji achọpụta onye mụ nwa (DNA) wee chọpụta na ọ bụ nwa Mao Zhenjing na Li Jingzhi.
Mao Yin onye nke a gụgharịrị aha dịka Gu Mingning kwuru na ya amabeghị maka ọ dị n’ihu mana ka ọ dị ugbu a, ọ ga-achọ ka ya na nne na nna ya nọrịa.
Otu o sila dị, ndị uweojii kwuru na ka a tọọrọ ya, e resịrị ya di na nwunye amụtaghị nwa. Mana o nweghị ihe ọ bụla e kwugoro gbasara di na nwunye ahụ.