A HỌPỤTALA dibia oyibo onye Nigeria dịka onyeisi ọrụ gbanụgbanụ maka ọrịa korona (COVID-19 task force) na Sierra Leone.Odogwu nwoke ahụ aha ya bụ Dọkịnta Laoluwa Adejayan ka e kwuru na e nyere ya nnukwu ọkwa ahụ ka ha tubechara ya ugo dịka dibia oyibo si mba ọzọ kacha eme nke ọma.
Dịka ha mere nke ahụ ha bulikwara ụgwọ ọnwa ya elu, nke pụtara na ọ na-erizi akatampo ego dị $20,000 ọnwa ọ bụla.
Adejayan gụrụ akwụkwọ ma turu ugo mmụta na Ladoke Akintola University, Ogbomoso, steeti Oyo.
Ọ rụrụ ọrụ obere oge na steeti Bayelsa ka o fechara ala nna ya National Youth Service Corps (NYSC) tupu ọ tụgharịa ọkpa egwu site n’ịga mba ahụ nke dị na West Africa site n’amụma a kpọrọ Technical Aids Corps Scheme n’afọ 2012.
Onyeisiala mba ahụ bụ President Julius Maada Bio kwuputara n’ezie nhọpụta Adejayan n’akwụkwọ ozi leta o zigaara onyeisiala Nigeria bụ President Muhammadu Buhari.
Bio kọwara nwa amadi Nigeria ahụ dịka onye na-egosipụta ịma mma obodo ya, ezigbo nwa afọ Nigeria. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ onye a zụrụ nke ọma, ụbụrụ ya na-anụ ọkụ ma bụrụkwa dọkịnta maara ihe ekwe na-akụ, na-agba mbọ nke ukwu.
Buhari, n’akụkụ nke ya kelere Adejayan maka ịbụ ezi nwa afọ ala anyị, onye e ji ama atụ na-egosipụta ima mma obodo ya.