NDỊ ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra nọ na Fraidee gara aga ọnwa Mee dị n’abalị iri abụọ na abụọ wee gbapee (flag off) ugbo ha nke a kporo Ugbo Azụ Ụnọ.
Ya bụ amụma bụ nke a bagidere iji kwado mbọ Gọvanọ Willie Obiano na-agba maka ịhu na nri zuuru ndị Anambra.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasara ọrụugbo, Chief Paul Nwosu onye nke onyeisi ụlọọrụ Clear Drainage and Forest Preservation Agency, Chido Obidiegwu nọchịtere kwuru na steeti Anambra n’akọ ha nwere adila na mbu bagide amuma ọrụugbo nke ga-enyere ndị nke ya aka tupurị korona amalite.
O kwuru sị: “Gọvanọ steeti Anambra bụ Chief Willie Obiano adịla na mbụ hụ echi site n’ịbagide amụma ọrụugbo na steeti iji hụ na nri zuuru ndị Anambra tupu korona anọkata malite.”
Ọ rụtụrụ aka na site n’amụma ọrụugbo nke steeti Anambra bagidere, ha agaghị agabiga oke ihe isi ike nke korona.
Ọ gakwara n’ihu kwuo sị: “Anyị nwere gọvanọ na-ahụ ọdịnihu. Site n’amụma anyị nwere anyị agaghị ahụta oke agụụ, mana anyị ga-adị nkwadebe ka a ghara ibere anyị ka mkpọ.”
Dịka ọ na-etọ ANPC maka mbọ ha na-agba, o kwuru sị; “O nwere otu ihe mere ANPC ji bụrụ ọ pụrụ iche. Ha na-ebu ụzọ, ndị ọzọ na-eso. Ụzọ ha si eme ihe na-adị egwu, o nweghị ụlọọrụ ọzọ bagiderela amụma a.”
N’okwu mmalite ya, onyeisi ụlọọrụ ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife kwuru si na ihe ha ji bagide ya bụ ọrụ bụ iji sonye hụ na nri zuuru ndị Anambra na ntuziaka nke Gọvanọ Obiano.
Nnabuife kwuru sị; “Anyị agabigala ọtụtụ ihe iche aka mgba na mbụ ma merie nke gụnyere agha World War nke mbụ na nke abụọ, anyị ga-emeri korona na agụụ ya na ya nwere ike iso. Ugbo Azụ Ụnọ ga-enyere ndị ọrụ aka n’ụzọ dị egwu iji gbanahi agụụ.”
Ọ gara n’ihu too ndị ọrụ ANPC maka mmasị ha nwere maka ọrụugbo nke mere na ala ezughị, e wee mezie ya onye ọ dabara (balloting).
Ndị bịara emume ahụ gụnyere: Chido Obidiegwu, Ifeanyi Aniagor, Jude Emecheta, Mike Meze, Chris Obinabo na ọtụtụ ndị ọzọ obodo jiri biri.
Ha niile toro ndị ọrụ ANPC maka mbọ ha na ịkwụdosike; ma kọwaa ọrụugbo dịka sọ ihe ga-azo mmadụ ma korona gafechaa.
N’ozi ekele ya (vote of thanks), Editọ akwụkwọ akụkọ National Light Oriakụ Rose Oranye kelere ndị niile bịara mmemme ahụ ma kwuo ka e were amụma a gọọmenti steeti Anambra wepụtara kpọrọ ihe.