Dibịa egbuola Pastọ bịara ka ọ gwọọrọ ya ọgwụ

0
154

NDỊ uweojii kọmandị steeti Ogun anwụchikọọla otu dibịa maka igbu Pastọ. Dibia ahụ gburu pastọ maka iji ya gwọ ọgwụ (rituals).

  Pastọ Kalejaiye Ezekiel ka e kwuru na ọ gakwuru dibia ahụ aha ya bụ Ogunkoya gbara afọ iri anọ na asatọ ka ọ gwọọrọ ya ọgwụ maka ụlọụka ya mana dibịa ahụ onye nke kwuru na ya onwe ya chọrọ nwoke o ji agwọ ọgwụ kpebiri ozugbo, gbuo Pastọ Ezekiel, ka o were ya gwọrọzie ọgwụ.

  Ogunkoya gwara ndị uweojii sị: “Pastọ ahụ bịara na nke m ịnata ike ka ụka ya wee na-eto, m jiri ohere ahụ were ya gboo mkpa nke m.Agwakọrọ m ihe na-atụ mmadụ ụra nye pastọ ahụ ọ ńụọ nke mere ka ụra buru ya. Ozugbo ụra buuru ya, m were mma gbuo ya. Abụ m onye dibịa ọdịnala, enyerela m ọtụtụ ndị mmadụ aka nke gụnyere ndị pastọ chọrọ ka ndị ụka ha na-abawanye n’ogbe. Ihe a merenụ dapụtara n’ihi na a chọrọ m akụkụ ahụ mmadụ m ga-eji gwọọrọ otu onye ahịa m n’Iseyin ọgwụ.”

  Dibia ahụ gara n’ihu rịọ ka a gbaghara ya n’ihi na ya matara na ya mejọrọ ma ọbụrụ na a jụọ ndị mmadụ a ga achọpụta na ya bụ ezigbo mmadụ na ya bụ ihe merenụ dapụtara dịka o siri dị.

  Onye okwuputa okwu ndị uweojii steeti Ogun Abimbola Oyeyemi kwuru sị na ọ bụ ndị uweojii ndị na-akwụsị ma na-enyocha ndị njem nwụchikọrọ ya n’ụzọ gara Iseyin. Ọ kọwara na a ga-agba mbọ chọpụta mmadụ ole o gburula n’ụzọ dị otu ahụ; n’ikpeaszụ, a kpọpụ ya ụlọikpe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here