… Gwa onyeisi uweojii Nigeria na ọ na-ada mba na mpaghara ahụ
OTU ahụ jikọtara ndị gọvanọ ndịda ọwụwa-anyanwụ ala Nigeria, bụ ndị a maara n’asụsụ bekee dịka ‘South-East Governors Forum’ akpọkuola onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Abubakar ka o lebàgharịa anya n’atụmatụ ahụ o wepụtara na nso nso a bànyere nchekwa ime-ime obodo mpaghara ahụ.
Ndị otu a kwupụtara nke a site n’ọnụ onyeisi oche ha ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Ụmahi, oge ha mechaara nzukọ ahụ ha na-enwe kwà ọnwa ọbụla, nke ọnwa Mee.
Ha kpọkuru onyeisi ndị uwe ojii, bụ Maazị Abubakar ka o wezugagodi atụmatụ nke ahụ o wepụtara banyere nchekwa ime obodo mpaghara ahụ, ma gbaso nkwekọrịta ahụ ya na ha nwere bànyere iwepụta ezi atụmatụ nchekwa ime obodo bụ ịgbà maka mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, oge ikpeazụ ọ bịara mpaghara ahụ, iji kwàlite ezi ọnọdụ nchekwa ime obodo na mpaghara ahụ.
Ndị òtu ahụ gbarụrụ ihu bànyere etu ya bụ onyeisi ndị uweojii siri gbakụta nkwekọrịta ahụ azụ ma wepụta usoro na atụmatụ ọzọ na-abụghị ihe ha kwekọrịtara.
Gọvanọ Ụmahị gazịrị n’ihu kọwaa na ndị òtù ahụ kwekọrịtara ma nye ntụziaka ka ụlọ omeiwu steeti dị iche iche na mpaghara ahụ malite imepụta iwu nchekwa steeti, n’ịgbaso atụmatụ nchekwa mpaghara ahụ, bụ ‘South East Joint Security Programme’.
N’ihe gbasara ọrịa nje korona, ndị òtù ahụ kwupụtara mkpebi ha ịgwa ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ijikwa mgbasa ọrịa na-efe èfè n’ala Nigeria, bụ ‘Nigerian Centre for Disease Control (NCDC)’ ka ha welitekwuo aka n’ọnụọgụgụ nnwale na nnyocha ha na-eme na mpaghara ahụ iji chọpụta ndị nwere ọrịa ahụ.
Ha kpọkukwara ma dụọ ụmụ Igbo bi na mpaghara ebe dị iche iche ka ha na-agbaso ma na-erube isi nye ntụziaka dị iche iche gọọmenti na ụlọọrụ ahụ ike nyere dịka ụzọ isi belata mgbasa ọrịa korona.
Ndị gọvanọ ahụ jikwara ohere ahụ wee lebà anya ma kparịtakwa ụka na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche, dịka o siri metụta mpaghara ahụ; ma werekwa ohere ahụ kelee gọọmenti etiti maka ọrụ ngo dị iche iche ọ rụrụ na nso nso a, ndị nke a ka ga-amalite amalite, nakwa ndị nke ka na-aga n’ihu ugbua n’ebe dị iche iche na mpaghara ahụ, nke gụnyere ọdụ ụgbọelu mba ụwa Akanụ Ịbịam, bụ ‘Akanu Ibiam International Airport’ dị na steeti Enugu; àkwà mmiri ohimiri Niger nke abụọ, bụ ‘Second Niger Bridge’ dị na steeti Anambra, tinyere ọrụ ngo ndị ọzọ.
Nzukọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Enugu, ma bụrụkwa nke dọtara ndị gọvanọ steeti ise dị na mpaghara ahụ, nke gụnyere Gọvanọ steeti Ebonyi, bụ Dave Ụmahi; nke Enugu, bụ Ifeanyi Ugwuanyi; ògbò ha nke Imo, bụ Hope Ụzọdịmma, tinyere nke Anambra, bụ Willie Obianọ, nke osote ya bụ Nkem Okeke nọchitere anya ya; nakwa nke steeti Abịa, bụ Okezie Ikpeazu, nke osote ya, bụ Ude Oko Chukwu nọchitere anya ya.
Ndị ọzọ sonyere na nzukọ ahụ gụyere aka chịbụrụ steeti Anambra n’oge mbụ, bụ Jim Nwobodo; onyeisi oche Ọhaneze Ndị Igbo, bụ Nnia Nwodo; onyeisi oche otu jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Nigeria, ma bụrụkwa eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Alfred Achebe.