A MALA otu pastọ bi Ondo aha ya bụ Kọlawole Samson ikpe ọnwụ maka igbu Ayo Olaniyi.
Olaniyi lara mmụọ ka e kwuru n ọ gara ịchụ nta mbara (frog); ya na mmadụ atọ ndị ọzọ n’ebe a na-azọ azụ (fish pond) nke pastọ Kolawole nwe.
A mara Kolawole ikpe n’ihi na o merụrụ Olaniyi ahụ site n’igbu ya mma n’isi, nke mere o jiri nwụọ n’ụlọọgwụ e bugara ya.
Ọ bụ ụlọikpe ukwu nke steeti Ondo dị n’Akure mara Pastọ Kolawole ikpe ọnwụ, nke Justice Ademola Bola nọ n’isi ya.
Otu o sila dị, Pastọ Kolawole kwuru na ikpe amaghị ya.
Justice Bola kpebiri na ịgbaama nke ụlọikpe ahụ nwetere gosiri na Pastọ Kolawole gburu Olaniyi.
Ọkaikpe ahụ kwubiri na Samson Kolawole ga-anwụ site n’ịtụ ụdọ (hanging).