AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ma dụọ ndị Anambra ka onye ọbụla dịwanye uchu, kee nkwụcha ma kpachapụ anya banyere etu ha si emeso ọrịa nje korona.
Gọvanọ Obianọ kpọrọ òkù a ma nye ndụmọdụ n’ozi izugbe ọ gbasara na nso-nso a maka ọrịa ahụ, bụ nke weere ọndụ n’ebe obibi ya dị n’Amawbịa.
Ọ kọwara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ime steeti ahụ dịka o siri metụta ọrịa korona, mee ka a mara na ọrịa ahụ egbuola onye ọzọ n’Anambra, ebe mmadụ ndị ọzọ bu ọrịa ahụ nọ ugbua na-anara ọgwụgwọ. O kwuru na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa hụ na steeti ahụ gbagòtere na nso-nso a n’ihi ọtụtụ nlele ahụ e mere n’ọdịnso a, ma kpọọ òkù ka ume ghara ịmapụ ndị mmadụ banyere nke ahụ.
Ka o sila dị, Gọvanọ Obianọ gbarụrụ ihu banyere mkpesa o nwetara banyere etu ọtụtụ ndị mmadụ, ụlọụka, ụlọọrụ na ahịa dị iche iche esighịzị erube isi na ntụziaka ahụ o nyere oge ọ na-amaghepu ụfọdụ ihe a machibụrụ amachi na steeti ahụ dịka ụzọ isi gbochie mgbasa ọrịa ahụ.
Ọ sị na ya nwetàra mkpesa na ọtụtụ ndị mmadụ anaghịzị eyi uwe mkpuchi imi were apụta iro, ma ya fọdụzie ndị nọ n’ime ahịa ikpù ya maọbụ debe mmiri e ji akwọ aka n’ọdụ ahịa ha dị iche iche.
Ọ katọrọ akparamagwa dị etu ahụ, ma dọọ aka na ntị na ọ bụrụ na ihe ndị ahụ gaa n’ihu, maọbụ ndị mmadụ gaa n’ihu inupù isi nye ntụziaka ahụ o nyere, ị mara na ọ ga-amàchikwa ihe niile ahụ ọ maghèpùru, mechikọọ ebe niile, ma tikwa iwu onye apụtakwala ezi dịka ọ dị na mbụ
O chetaara ndị Anambra na ya èbinyela aka n’amụma iwu COVID-19, ma kpọkuo onye ọbụla ka o rube isi nye iwu ahụ n’ihi na ọchịchị ya ga-agbasi mbọ ike itinye ya n’ọrụ n’ozuzu oke.
Aka na-achị achị bụ Obianọ gara n’ihu gwa ụlọ ahụ ike niile dị na steeti ahụ ka ha wepụta ebe a ga na-edobe ma na-elekọta onye ọbụla ọnọdụ ahụ ike ya dị njọ nke ukwuu bịara ịnara ọgwụgwọ ebe ahụ, maọbụ ndị a na-enyo ènyo na ha nwere ọrịa korona, wee ruo mgbe e wepụtara mpụtara nlele ahụ e mere ha.
Ọ gwakwazịrị onye ọbụla ka ọ na-eri ezigbo nri na ihe ndị ọzọ dị iche iche ga-enye aka ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa ahụ ike ha, n’ihi na nke ahụ sokwa n’otu ụzọ mmadụ pụrụ isi gbanahị inweta ya bụ ọrịa ọjọọ na-efe èfè.