CHISOM Eze gbara afọ iri abụọ na otu egbuola nwanne ya nwoke Henry gbara afọ iri na iteghete, dịka ha na-alụ ọgụ maka otu olilo mmanya ọtọ bịrịbịrị.
Ọdachị ahụ dapụtara n’ụlọ ebe ha bi na Lagos.
Chisom ka e kwuru na ọ hapụrụ mmanya ahụ n’ụlọ wee pụọ mana oge ọ lọtara ọ chọpụtara na Henry ańụọla mmanya ahụ.
N’iwe n’ihi na nwanne ya ńụrụ mmanya ya, Chisom weere mma sụọ Henry n’olu.
Otu o sila dị, nwanne ha nwaanyị, onye hụrụ mgbe njinji ahụ na-eji tiri mkpu nke mere ka ndị agbataobi bịa jide Chisom.
Mbọ niile a gbara ịzọpụta Henry lara n’iyi n’ihi na ọ nwụrụ maka mmerụ ahụ.
Mgbe a kpọtụụrụ ya, onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii steeti ahụ bụ Bala Elkana kwuru sị; “Chisom sụgburu nwanne ya nwoke nke obere, Henry n’ihi otu olilo mmanya ọtọ bịrịbịrị. Ọ nọ n’aka anyị ugbu a. Nnyocha na-aga n’ihu.”