GỌVANỌ na-achị steeti Anambra bụ Chief Willie Obiano enyela ndịisi na-emepụta akpati e ji eku ume (oxygen) bụ Anambra State Oxygen Production Plant ntụziaka ka ha bunye ụlọọgwụ ọha na eze (General Hospital) na ụlọ ahụike (Primary Healthcare Centers) niile dị na steeti ahụ akpati ikuta ume n’efu.
Dịka nwoke gbara afọ iri isii na isii nwụrụ nsonso a, ọnụọgụ ndị na-arIa korona na-agbagokwa.
Mgbe ọ na-ekwupụta nke ahụ n’Awka, onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Dọkịnta Onyekachukwu Ibezim kọwara na inyefe akpati okuku ume ahụ n’efu n’aka ụlọọgwụ dị iche iche ga-aga n’ihu ọnwa abụọ. Nke ahụ malitere ka ọnwa Mee dị n’abalị iri abụọ na asaa, n’afọ a bụ 2020, dika e kwuputachara ya.
O kwuru sị: “Gọvanọ enyela ntuzi aka ka ndị ụlọọgwụ ọha na eze (General Hospital) na ụlọahụike ‘Primary Health Care Centers’ ndị chọrọ akpati okuku ume kwuo ozugbo site n’ọfiisi nke kọmishọna na-ahụ maka ahụike; ka ha buru ya ozugbo n’ụlọọrụ ahụ, n’Amaku Awka.