Ụwa etoola Majek Fashek lara mmụọ dịka odogwu

0
86

NDỊ mmadụ akọwaala Majek Fashek onye Nigeria na-eti egwu, a maara aha ya, nke lara mmụọ dịka odogwu.

  Majek Fashek bụ eze egwu reggae lara mmụọ na Monde ka ọ gbachara afọ iri ise na asaa.

  Manija ya bụ Omenka Uzoma kpọrọ oku ka e cheta ndụ ya, ike ọ kpara na ezinaụlọ ya. O kwuru na ọ ga-eme ka ọha na eze mata otu ọbụla ezinaụlọ ya ga-esi hazie ihe.

  A mụrụ Majek Fashek na Benin-City, steeti Edo. Ọ kpara ike n’ihe gbasara iti egwu n’ala Nigeria iri afọ olemole gara aga (80’s).

  Egwu ya kacha pụta ihe bụ n’efere egwu Prisoner of Conscience (1988) nke gụnyere egwu nke o ji nweta ọtụtụ ihe nkwanyeugwu (award), nke ọ kpọrọ ‘send down the rain.’

  Ya na ọtụtụ ndị nwere ọnatarachi n’ihe gbasara iti egwu arụkọọla ọrụ n’ụwa niile, ndị gụnyere; Tracy Chapman, Jimmy Cliff, Michael Jackson, Snoop Dogg na Beyonce.

  N’agbanyeghị ihe iche aka mgba o nwere n’ebe ahụike ya nọ, ọ tụnyere ụtụ ya site n’iwepụta ihe onyoonyoo iji gwa ndị mmadụ mkpa ọ dị ibuso ọrịa korona agha.

  Majek hapụrụ ụmụ ya, ikwu na ibe, na ndị hụrụ ya n’anya ka ha rube ụjụ ọnwụ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here