IGBO sị na ọ na-abụ egwu dagharịa, a tụgharịa ọkpà egwu, maka na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.
N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra ewepụtala usoro ọhụụ a ga na-agbasozị wee na-akwa ozu n’ime steeti ahụ, iji belata mgbasa ọrịa nje korona na ya bụ steeti.
Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ n’isi mbido izuụka a banyere usoro ọhụụ ahụ, bụ nke ọ bụ ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu binyere aka na ya.
Ọkammụta Chukwulobelu sikwara n’ozi ahụ chètara ọhaneze steeti ahụ na Gọvanọ Willie Obianọ ebinyela aka n’akwụwkọ iwu korona, bụ nke kpọpụtasịrị ntụziaka dị iche iche a ga na-agbasozị na steeti ahụ ugbua maka ọrịa ahụ, ya na ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla nupùrù isi na nke ọbụla n’ime ya.
Dịka o siri dị n’usoro ọhụụ ahụ e wepụtara a ga-esi na-akwazị ozu, onye ọbụla mmadụ nwụnahịrị ga-eli ya ozigbo, ma bụrụkwa nke a ga-eme n’ịgbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyere maka ibelata mgbasa ọrịa korona.
Ozi ahụ a kụpụrụ kọwara na a gaghị na-akarịzịkwa mmadụ iri atọ n’otu mgbe n’ebe ọbụla a na-akwa ozu na steeti ahụ, ma mekwa ka a mara na onye ọbụla nọ ebe ahụ a na-akwa ozu ga-eyirịrị uwe mkpuchi imi bụ facemask, ma nọpụgakwa anọpụga n’ebe mmadụ ibe ya nọ.
Ya bụ ozi kọwakwara na a ga-edoberịrị itè mmiri na-agba agba, nchà, na mmanụ nkwọcha aka bụ hand sanịtaịza n’ebe ahụ a na-akwa ozu maka ndị mmadụ ịkwọ aka ha, ma sịkwa na a ga-eji akụrụngwa ahụ e ji enyocha etu ọnọdụ ọkpọmọkụ ime ahụ mmadụ siri gbata kwụrụ, bụ tamọmita, wee na-anwale ọnọdụ ọkpọmọkụ ime ahụ mmadụ ọbụla bịara ebe ahụ n’ọnụ ụzọ ama tupu e kwe ya ka ọ bànye n’ebe ahụ a na-akwa ozu.
Ozi ahụ dọkwara aka na ntị ka a ghara ikwe ka onye ọbụla ọnọdụ okpomọkụ ime ahụ ya gafere 37.9 sentigredi gafee maọbụ bànye n’ebe ahụ.
Ya bụ ozi dọkwazịrị ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo dị iche iche aka na ntị ka ha buru ozi ahụ bàá n’ime obodo ha, gbasie mbọ ike ma kpachapụkwa anya ịhụ na ndị ọbụla na-akwa ozu n’obodo ha rùbèrè isi nye ntụziaka ọhụụ ahụ, n’ihi na ọ bụ ha ka gọọmenti ga-ejide ma e nwee onye ọbụla dara iwu ahụ n’obodo ha.