Korona: Ụmụafọ Ossomala bi na USA ekesàràla ndị obodo ha erimeri

0
133

ỤMỤAFỌ obodo Ossomala dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru bi na mba USA ekesàarala ndị obodo ahụ akpa osikapa ruru iri abụọ na asatọ n’ọnụọgụgụ, iji belatara ha agụụ na ihe isi ike ndị ọzọ ha nwere ike ịdị na-agabiga n’ime oge ugbua n’ihi ọrịa nje korona.

  N’okwu ya na mmemme ikesà erimeri ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu; onye nyefere ihe ndị ahụ n’aka ndị obodo ahụ (n’aha ndị butere ya), bụ Oriakụ Ijeoma Uche kọwara na ọrịa korona a metụtara ma onye ukwu ma onye nta n’ụzọ dị iche iche.

  Ọ kọwara na ọbụnadị ndị ahụ butere ihe erimeri ahụ ka e kesesàára ha ketàkwàra òkè na mmetụta nke oge ọrịa korona a, n’ihi na ha anaghịzị aga ọrụ ogologo oge niile ahụ gọọmenti mba USA tiri iwu onye apụtakwala ezi; kama na o metụrụ ha n’obi inyere ha bụ ụmụnne ha aka, bụzị nke mere ha jiri kpebie ikesàrà ha akpa osikapa ahụ.

  N’okwu nke ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu, nke onye nọchitere anya ya bụ otu onye n’ime ndị ichie ya, bụ Maazị Patrick Chukwuma fọrọ ekele n’ụkpa wee bunye ndị ahụ tụkọtara erimeri ahụ, ma kọwaa ha dịka ndị obodo ahụ ji eme ọnụ.

  Ọ gakwazịrị n’ihu kpee ka Chineke gọzie, kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji, ma na-echekwaba ha oge pụọ n’ajọ ọrịa ahụ.

  Maazị Stephen Mbieri bụ onyeisi ógbè Isiolu dị n’obodo ahụ tinyekwara olu wee kelee ndị ahụ bunyere ha erimeri ahụ, ma kwe nkwà na a ga-ekesa ya etu o siri kwesi.

GUO:  WHO adọọla Africa aka na ntị banyere ileghara ntụziaka korona anya

  A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee kee akpa osikapa ahụ nyegara ndị nnọchianya ógbè iteghete e nwere n’obodo ahụ ka ha gazie kesaara ndị ógbè ha dị iche iche.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here