Na Kaduna, nwaanyị ji ụmụ Iri na atọ a mụọla ejima anọ

0
132
Nwaanyị na ụmụejima anọ ya

OTU nwaanyị aha ya bụ Hauwa’u Sulaiman gbara afọ iri atọ na anọ, ma bụrụ onye mụrụla ụmụ iri na atọ na mbụ a mụọla ejima  anọ (quadruplets).

  Ọ bụ n’ụlọọgwụ Gambo Sawaba General Hospital, Zaria nke dị na steeti Kaduna ka ọ mụrụ ha.

  Nwaanyị ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ya abụrụla onye e ji ụmụ iri na asaa gọzie.

  Dịka a mụchara ụmụaka ahụ, e mechara ziga ha ụlọọgwụ Ahmadu Bello University Teaching Hospital, Zaria (ABUTH). Ejima nke bụ otu nwoke n’ime ụmụaka ahụ nwụrụ tupu ha eruo ABUTH, ma ụmụnwaanyị atọ ndị ọzọ nọ n’ezi ahụike dịka a na-elekọta ha na ngalaba ụmụaka n’ụlọọgwụ ahụ, ebe nne ha nọ na ngalaba ndị mụrụ nwa.

  Nne ejima ahụ kwuru sị: “Agbasiri m ike nke ọma. Ndị ọrụ ahụike kwuru na a ka ga-elerukwu anyị anya tupu a hapụ anyị ka anyị laba.”

  Di ya bụ Sulaiman Muhammed kọwara na nwunye ya adịla na mbụ mụọ ejima atọ ugboro abụọ, ejima abụọ ugboro abụọ,otu nwa ugboro atọ, n’oge dị iche iche tupu ọ mụọ ejima anọ ugbu a.Muhammed bụ onye ọkwọ ụgbọala, kelere Chineke maka iji ụmụaka ndị ahụ wee gọzie ha.

  N’akụkụ nke ya, onyeisi ndị dọkịnta na ngalaba ụmụaka ABUTH bụ Isa Abdulkadiri kwuru na ụmụaka ahụ nọ ọnọdụ dị mma.

GUO:  Mmadụ itoolu anwụọla na Kadụna n'ihi mwakpò ndị omekome

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here