ONYE uweojii nke nọ na Special Protocol Command Unit nke steeti Lagos aha ya bụ Sergent Okema Azuquo a sụgbuola lnspector Adekunle Ilesanmi Francis. Ọdachi a dapụtara n’Oke-Ado dị na steeti ahụ.
Azuquo sụrụ Francis mma n’ụlọ ebe obibi ha (rented apartment) nke mere na ọ nwụrụ ka ọ nọchara abalị olemole n’ụlọọgwụ.
A kọwara na nsogbu dapụtara dịka Azuquo ṅụchara mmanya o wee gbuwe ya; ka ọ lọtara o buuru mma chụba otu nwoke bi n’ebe ahụ ọsọ nke mere ka Francis pụta gbochibe ya. N’ihi iwe na onye o ji mma achụ agbapụla n’ihi Francis, ọ wakpoziri Francis gbuo ya mma ugboro ugboro.
E bugara Francis ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ n’ụtụtụ Mọnde ka ọ gachara abalị olemole.
Otu onye agbataobi achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị: ” Onye uweojii ahụ bụ Azuquo bụ nnukwu nsogbu nye ndị niile bi n’ogbe a, ọ kachasị anyị bụ ndị ha na ya bi n’ụlọ.Ọ bụ Francis bụ onye na-egbochi ya.Ugbu a a nwụchikọrọ ya n’ihi na o gburu onye otu ya, ana m eche na anyị ga-enwe udo n’ogbe anyị.”