ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ na ọnọdụ ntụmadụ n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Emergency Management Agency (NEMA)’ ebunyela ahịa Mgbuka Obosi ahụ dị na steeti Anambra akụrụngwa dị iche iche e ji arụ ụlọ, iji tie ya aka n’obi na iji kwàdo ya idozigharị ihe dị iche iche mebiri emebi n’ihi ajọ ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n’ahịa ahụ n’abalị iri na otu nke ọnwa Jenụwarị ahọ a.
Akụrụngwa ahụ bụ nke ụlọọrụ NEMA nyèrè n’aha gọọmenti etiti, ma bụrụkwa nke gụnyere àkpà simeentị dị narị iteghete na iri atọ, akụrụngwa sìlìn e ji akụchi elu ụlọ (bụ ceiling board) dị narị iteghete na iri atọ, ùkwù gbamgbam dị narị iteghete na iri atọ, na akpa ntu e ji akụ ụlọ.
N’okwu ya oge ọ na-enyefe akụrụngwa ahụ n’aha gọọmenti etiti n’isi ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ na steeti ahụ, onyeisi ụlọọrụ NEMA n’ala Nigeria, bụ Maazị Muhammadu Alhaji Muhammadu, nke ọ bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Maazị Fred Anwusim nọchitere anya ya, kọwàra nke ahụ dịka ótù n’ime ụzọ gọọmenti etiti siri chọọ iti ndị ahụ aka n’obi bànyere ajọ ọdachi ahụ dabidoro ha.
O kwukwara na ebumnobi nke ahụ bụ iji kwàdo gọọmenti steeti ahụ n’agbambọ ya ịrụgharị na idozigharị ụfọdụ ebe ajọ ọkụ ọgbụgba ahụ mebisiri ihe n’ahịa ahụ.
Na nzaghachi oge ọ na-anabàta akụrụngwa ahụ n’aha ọchịchị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dọkịta Nkem Okeke kelere ụlọọrụ NEMA na gọọmenti etiti maka mgbata ọsọ ahụ na nkwàdo ya, ma kọwaa na nke ahụ ga-enyere gọọmenti aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịrụgharị ebe ndị ahụ ọkụ gbarikọrọ.
O kwukwara na gọọmenti steeti ahụ ga-aga n’ihu n’ịkpọtụrụ na inweta nkwàdo site n’aka gọọmenti etiti mgbe ọbụla ọ dị ya na mkpa, ọbụnadị dịka o kpere ka ụdịrị ọdachi dị etu ahụ ghara ịdapụtazị ọzọ n’ọdịnihu.
Na ntụnye nke ya, onyeisi oche n’ahịa Mgbuka Obosi ahụ, bụ Maazị Samuel Ezeobodo kelere gọọmenti etiti na ọchịchị steeti Anambra maka nkwàdo esepughị aka ha na-enye ahịa ahụ na ndị na-azụ ahịa ebe ahụ kemgbe ụbọchị ahụ ọkụ gbara ebe ahụ, ọbụnadị dịka o kwere nkwà na ha ga-eji akụrụngwa ahụ wee rụọ ọrụ etu o kwesiri.