DAKPO ụmụnwaanyị ma kwaa ha iko n’ike bụzi egwu e ji n’ala anyị bụ Nigeria ugbu a.
Ọ na-awụ akpataoyi ma na-agba anya mmiri n’ihi ya bụ ihe nke jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi.
Nke ka njọ bụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-akwasazi ụmụ ha nwaanyị ma ndị e ku n’aka iko.
Ka ọ dị ugbu a, iwe na ọnụma juru ụmụ Nigeria obi n’ihi ogbugbu e gburu nwata akwụkwọ University of Benin, Vera Uwaila Omozuwa, gbara afọ iri abụọ na abụọ, onye e gburu dịka a kwachara ya iko n’ike ebe ọ gara ị gụ akwụkwọ n’ụlọụka Redeem Christian Church of God nke dị na Benin.
Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ihe dị otu a nke a na-anụ n’ala anyị kamgbe izuụka olemole, ma bụrụkwa nke kpatara ngagharị iwe na nkatọ site n’aka ndị mmadụ.
Ezinaụlọ Uwaila nọ n’akwa arịrị dịka e gburu nwa ha nwaanyị n’ike. Joy Omozuwa, nne ya nọ n’uru dị egwu, ọbụghị sọọsọ maka na nwa ya nwụrụ anwụ kama n’ihi ọnọdụ ihe mgbu na mmerụ ahụ nke o ji anya ya abụọ hụ n’ebe nwa ya nọ, ma bụrụ nke ọ gabigara wee nwụọ.
Dịka nne ya na-ebe akwa na-ajụ ma onwere onye ya mejọrọ, nna ya bụ Johnson Omozuwa, onye kọwara nwa ya nwaanyị lara mmụọ dịka ezigbo nwata anya ruru ala kpọkuru ndị ọrụ nchekwa ka ha leruo anya ala ma chọpụta ebe mmiri si baa opi ụgbọgụrụ; nke ga-eme ka a nwụchịkọọ ndị kpara arụ ahụ.
Onye kụziiri ya na kọleji ma bụrụkwa osote onyeisi ụlọakwụkwọ ha oge ahụ, Edith Otoibhi kọwara ya dịka nwa maara akwụkwọ, mara ihe, na-ekwu eziokwu ma nwekwaa nsọpụrụ n’ebe mmadụ nọ.
Otu o sila dị, ndị uweojii ekwuola na ha anwụchịkọọla ndị mmadụ maka ya bụ arụ. Ha kọwara na ndị ọ kacha mara enyochaala ma chọpụta mkpụrụaka (fingerprint) nke onye ahụ a nwụchikọrọ n’ihe e ji emenyụ ọkụ (fire extinguisher) ha jiri kụgbu ya.
Ọga kpatakpata ndị uweojii ekwuputala na a ga-eziga ndị nnyocha pụrụ iche n’ogige ndị uweojii niile n’ala anyị, ndị ga na-ahụ maka ndakpo na mmetọ ụmụaka.