Obiano ekesaara ndị ntorọbịa Anambra osikapa

0
74

ỌŃỤ dara na steeti Anambra na nsonso a dịka ọchịchị Willie Obiano kere akpa osikapa dị narị anọ nye ndị ntorọbịa obodo dị otu narị na iri iteghete na otu dị na steeti ahụ n’otu n’otu.

  E kwuru na e bunyekwara ndị ntorọbịa si obodo ndị ka n’ọnụ ọgụ akpa osikapa karịa ibe ha. Ha gụnyere Onitsha, Obosi, Ogbaru, Nkpor, Awka, Nnewi na ndị ọzọ.

  Ikesa osikapa ahụ nke malitere n’Aguleri nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra East ka e kwuru na ego e tinyere na ya ga-eru ọkara ijeri naịra ma bụrụ nke a kọwara na e mere ya iji mejupụta nkwa Gọvanọ Obiano kwere ịgbatara ndị ọ na-achị ọsọ enyemaka na nsogbu korona.

  Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na ihe gbasara echichi chiifu (Commissoner for Local Government, Community and Chieftaincy Affairs) Maazi Greg Obi hafere osikapa ndị ahụ n’aka ndị nnọchite ndị ntorọbịa na steeti ahụ n’aha Gọvanọ.Ọ kọwara na Obiano kpebiri ịkwalite ndụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorọbịa.

  Obi kwuru sị: “Usoro e wepụtara bụ na ndị a ga-ebunye osikpa a bụ ndị ntorọbịa ụwa na-atụ n’ọnụ. Onweghị ezinaụlọ ga-ekete karịa otu akpa osikapa. Ọ bụ eziokwu na ndị ntorọbịa ka ọ dị n’aka ịhazi ihe banyere nke a ma ndị eze ọdịnala,ndị isi obodo(PG) na ndị ndu ụmụnwaanyị, ga-eleba anya ma nyochaa aha ndị e dekọtara.”

  Kọmishọna na-ahụ maka ọdị mma ndị ntorọbịa (Youth Entrepreneurship and Creative Economy) Maazị Afam Mbanefo toro Obiano maka afọọma ya, nke ọ na-eme n’akpaghị oke okpukperechi ma ọ bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ.

  Onyeisi otu jikọtara obodo niile dị na steeti Anambra,ASATU, ngalaba ndị ntorọbịa Maazị Patrick Agha Mba toro gọvanọ Obianọ maka ihụnanya o nwere n’ebe ndị ntorọbịa nọ ma kwe nkwa ezi nkwado ha n’ebe ọchịchị ya dị. Ọ gara n’ihu kwuo na e kesaala osikapa niile ahụ n’obodo niile n’enweghị nsogbu ọbụla.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here