AKPATAOYI wụrụ ndị mmadụ dịka ha gụrụ site n’ọnya nwudude (social media) ka otu onye ohi siri bịa ohi n’ụlọ mmadụ wee rurukwuo nkịta na-eche ụlọ, dịka o zuchara ohi.
Njinji ahụ jiri na Magodo nke dị na Lagos.
Ka o zuchara ohi n’ụlọ ahụ pụọ, ndị uweojii mechara wụchikọọ ya.
Site n’usoro mgbasaozi tụwita, e gosịrị foto onye ohi ahụ na ihe ndị ahụ o zuru n’ohi, tinyekwara nkịta ahụ.
Onye gbasara ozi ahụ n’ikuku kwuru sị: “Iji bee okwu nkenke, nwa amadị ahụ kụwara ụlọ na Magodo Lagos wee zuru Tiivii abụọ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ niile o zuuru, ọ gara n’ihu zurukwuo nkịta na-eche ụlọ ahụ.Nkịta nke kwesịrị iche onye nwe ya ka e zukwuru n’ohi tinyere ihe ndị e zuru e zu. Ọ dịkwa m egwu o.”