DỊKA ótù ụzọ isi tụnye ụtụ nke ya iji belata mgbasa ọrịa nje korona na steeti Anambra, òtù jikọtara ọba akwụkwọ n’ala Nigeria (nke a maara na bekee dịka ‘Nigeria Library Association’), ngalaba ya nke steeti Anambra eburula ozi nkuzi bànyere ọrịa ahụ gaa wee na mpaghara ebe dị iche n’ime ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ.
Atụmatụ inye nkuzi ahụ bụ nke a weere ọnọdụ ma n’ahịa, n’ọdụ ụgbọala, ogige ebe obibi ndị uwe ojii, nà mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kèé ndị mmadụ uwe mkpuchi imi (bụ facemask) karịrị otu puku n’ọnụọgụgụ.
N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka ma bụrụkwa onye lekọtara atụmatụ ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti (Anambra Central) bụ Dọkịta Nkechi Udeze kwuru na ebumnobi ha jiri bagide na nke ahụ bụ maka na ha chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ enweghị uwe mkpuchi imi, ebe ụfọdụ nwere ya anaghịzị ekpuchi imi ha ma ha na-aga n’ụzọ, bụzị nke mere ha jiri nwee ọnụnụọkụ n’obi inye aka n’ụzọ ha nwere ike.
O kwuru na ọ tụrụ ya n’anya etu ndị mmadụ siri nupụta n’ìgwè iji keta òkè n’uwe mkpuchi imi ahụ e kesàrà ụbọchị ahụ, bụ nke o chèbụrụ na ha agaghị enwe mmasị na ya. Ọ gara n’ihu kwupụta olileanya na ntụkwasị obi o nwèrè na ụdịrị atụmatụ dị etu ahụ ga-enye aka n’ọtụtụ ụzọ pụrụ ichè ime ka ndị mmadụ mara ihe ha kwesiri ịma bànyere ọrịa ahụ, tute mmụọ ha ime ihe ha kwesiri ime iji gbanahị ibute ya bụ ọrịa, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ bèlata mgbasa ọrịa ahụ.
Na ntụnye nke ya, onye lekọtara atụmatụ ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo ‘Anambra North’ ma bụrụkwa onye ode akwụkwọ òtù NLA na steeti ahụ, bụ Oriakụ Ngozi Osuchukwu kọwara na nke ahụ so n’ótù n’ime ezi ọrụ pụrụ iche òtù ahụ na-abagide, dịka òtù jikọtara ndị na-arụ n’ọba akwụkwọ. Ọ gakwara n’ihu gbaa akaebe na ihe ahụ ha mere enyela aka ma mịta mkpụrụ n’ụzọ dị iche iche, mee ka ụfọdụ mmadụ ghọta mkpà ọ dị ikpùchi imi ha oge niile, nwee, na-eyi, ma na-gbanwekwa uwe mkpuchi imi ha oge niile, tinyekwuoro na o mepeela anya ụfọdụ mmadụ ịghọta na ịma ihe banyere ọrịa korona nke ọma, karịa ka ha mà na mbụ.
N’akụkụ nke ya oge ọ na-akọpụta ụfọdụ ihe ha hụtara oge ha na-ekesà ihe ahụ ụbọchị ahụ, onye lekọtara atụmatụ ahụ na mpaghara ‘Anambra South’, bụ Maazị Umego Valentine Chukwuebuka, nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, kọrọ akụkọ etu ndị mmadụ siri nupùta n’ìgwè ụbọchị ahụ ma na-ekwò onwe iji nweta uwe mkpuchi imi ahụ.
Dịka o siri kọwaa, nke ahụ gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ nwere mmasị iyi uwe mkpuchi imi ahụ, mana ha enweghị ya, ebe ụfọdụ ndị mmadụ nwèrè naanị ótù. Ọ kpọkùzịrị gọọmenti ka ọ zụta ma kesààrá ndị mmadụ uwe mkpuchi imi ahụ n’ụba, ma ndị nwere mbụ ma ndị enwebèghị, iji bèlata mgbasa ọrịa ahụ.
Ụfọdụ ndị ritere urù n’atụmatụ ahụ ụbọchị ahụ, nke gụnyere Oriakụ Uzoamaka Akigwe na Maazị Clement Orakwe kèlèrè òtù NLA maka ezi ọrụ ahụ, ma kwezie nkwà na ha ga-amalitezị ikpuchi ime ha oge niile ma na-erubekwa isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti na ụlọọrụ WHO nyere dịka ụzọ kacha mma isi gbanahị ibute ọrịa ahụ na ibèlata mgbasa ya.
Ụfọdụ ndị òtù ahụ sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè Oriakụ Ify Okonkwo, Oriakụ Ada Obuezie, Oriakụ Ezeibe Franca, Oriakụ Ogueto Julia Chinwe, Oriakụ Perpetual, Maazị Alpho Ekpemogu, Oriakụ Chinyelu Mba, Oriakụ Ifeyinwa Okonkwo, Nwaada Chisom Nwadibe, Oriakụ Ijeoma, Oriakụ Adaora Obuezie, Oriakụ Chioma Onyenucheya, tinyere ndị ọzọ.