ONYEISI chọputara otu a kpọrọ Beecharity Outlook Foundation bụ nwaada Iwuoba Ogechukwu Blessing enweela mkparịta ụka nke dị n’etiti ya na onyeisi na-elekọta ụlọọrụ Anambra Newspaper and Printing Corporation ma bụrụkwa ndi na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, nakwazị SportsLight Xtra, bụ Sir Chuka Nnabuife n’ọfiisi ya iji nye nkwodo banyere atụmatụ mmegide ajọ ọnọdụ ụmụaka n’ụwa niile ma bụrụ nke otu ahụ kpọrọ Say No To Child Labour.
Iwuoba ekwuola na otu ahụ ga-eme ncheta ọnọdụ ọjọọ ụmụaka na mkpụrụ abalị iri n’ọnwa June na Steeti Anambra. O kwuru nke a na mkparịta ụka nke dị n’etiti ya na onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife n’Awka.
Ọ kọwara ya dịka ọnọdụ jọgburu onwe ya n’etiti ụmụaka na ndi na-azụ ha n’ụzọ dị iche iche. Iji maa atụ, ọnọdụ agụghị akwụkwọ ma ọ bụ Almajiri ma kwue na ncheta ahụ ga-abụ ịgbasa ozi n’ụzọ Televishọn, Redio nakwazi akwụkwọ akụkọ nke Anambra iji megide mmegbụ ma ọ bụ agaghị akwụkwọ ụmụaka n’ala Nigeria.
N’okwu ya, ọ sịrị na mmemme ahụ bụ nnọọ nke ha na-eme kwa afọ ọbụla ma bụrụ nke malitere na Steeti Enugu, Lagos na Anambra n’ihi mbawanye n’ọnụọgụ ụmụaka e rere ere ma ọ bụ ndị e jiri gbara ohu ma kwue na ncheta ahụ ga-enye aka iji belata ọnọdụ ọjọọ ụmụaka a.
Ọ gara n’ihu rịọ onyeisi ọlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife ka ọ kwado atụmatụ otu ahụ dịka ha na-atu anya na ọ ga-amịta ezi mkpụrụ.
O kwuru sị; “Ọ bụrụ na ụmụ anyị agụghị akwụkwọ ma ọ bụ enweghị ezi ndụmọdụ maka ọdị n’ihu ha, anyị agaghị enwe ezigbo ndị ndu n’ọdị n’ihu. Ọ ga- enyere anyị aka iji mee ka ndị mmadụ lebanye anya n’ihe gbasara imegide ụmụaka nakwa agụghị akwụkwọ ma ọ bụ ntaramahụhụ dị iche iche a na-ata ụmụaka. Nke a mere otu a jiri nwee mmasị ihụ onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife iji nye ya uwe njiri mara anyị ma rịọ ya ka akwado anyị na ịgbasa ozi a, n’ụzọ ibipụta akwụkwọ n’asụsụ Igbo nakwa Oyibo nke Steeti Anambra. N’ihi ajọ ọrịa korona, anyị agaghị enwe ike eme ya dịka nnukwu ọgbakọ iji sonye ntụzi aka gọọmenti na imegide ajọ ọrịa a”.
Nwada Ogechukwu nyere ndụmọdụ ma rịọ ka ndi okenye ma ọ bụ nne na nna kaba ahụ n’ịzụ ụmụ ha n’akwụkwọ iji belata ajọ akparamagwa ụmụaka n’abawanye n’ọnụọgụ.
Nnabuife n’oge mkparịta ụka ya na onyeisi otu ahụ kwuru na ọ bụ nnukwu atụmatụ nke ụlọọrụ ya nwere mmasị ịkwado ma kelee onyeisi ahụ maka agbam mbọ ya n’ebe ụmụaka nọ, ma gaa n’ihu kwue na ajọ ọnọdụ a bụ nnọọ ihe onye ọbụla kwesịrị ikwado iji mee ka ụmụaka nwee ezigbo agamnihu nwere ike ikwalite ọnọdụ akụnụba ala Nigeria site n’ezigbo nkuzi na ndumọdụ e nyere ha n’ụlọakwụkwọ ma ọ bụ ezinụlọ.
N’okwu ya, ọ sịrị,”Ntaramaghụghụ ụmụaka n’ụzọ ezighe ezi abụrụla okwu a kpụ n’ọnụ n’oge ugbu a. Ajọ ọnọdụ a kpatara Almajeri na ndị omekome jiri karịa n’ọnụọgụ na mpaghara obodo anyị dị iche iche. Ọtụtụ ndị nne na nna na-enwezị mmasị ire ụmụ ha n’ihi oke ọchịchọ karịa ịzụ nwata n’akwụkwọ, ebe ụmụaka ndị nwaanyị na-agba akwụla. Atụmatụ iji megide ajọ ọnọdụ a ga-enye aka mee ka ụmụaka anyị nwee ezigbo akparamagwa n’ọdịnihụ”.
Sir Nnabuife kọwara na gọọmenti Anambra nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n’isi ya ma bụrụ nke nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA, nwere iwu megidere ọnọdụ a ma gaa n’ihu kwue na steeti a bụ ndị mbụ kwadoro nwaanyị chịrị ọchịchị dika Gọvanọ steeti n’oge gara aga, kwekwazịa nkwa na ụlọrụ ya ga-enye otu ahụ nkwado na ịgbasa ozi atụmatụ otu ha n’ụwa niile.