NKPỌKỊTỊ bụ ọpụrụ iche dị n’egwu e nwere n’Igbo. E hibere ya n’ala Umunze nke dị n’okpuru ọchịchị Orumba South (ochie Aguata) n’afọ 1959. Ọ bụ odogwu nwoke, Chief Festus Okoli lagoro mmụọ, onye e ji Ojimgba mara (1927-2009), hibere ya.
Nkpọkịtị Umunze (Nkpọkịtị Unique Cultural Dance Group) dịka ndị mmadụ na-akpọ otu egwu ahụ na-eji ụzọ dị iche iche (styles) nke gụnyere irigo n’elu onwe ha wee na-eme ndị na-elele ha obi ụtọ. N’ikwu eziokwu, ọ gbara ụwa gharịị etu ha si agba egwu.
Ha gara asọmpi dị iche iche n’ala anyị bụ Nigeria ma turu ugo lọta. N’afọ 1970, dịka steeti niile gbakọtara ka a ṅụrịa maka agha a kwụsịrị; ha gbara ndị nke mbụ wee turu ugo buru ihe onyinye ha laa.
Otu ahụ ka ha si aga asọmpi ma na-agba ndị nke mbụ oge niile.N’ihi ya, gọọmenti Anambra steeti ochie họọrọ ha dịka egwu steeti ji aga asọmpi egwu ọdịnala.
Dịka ha na-aga n’ihu na-eturu ugo n’ike n’ike n’asọmpi ala anyị, Gọọmenti Etiti kpọrọ ha gaa mba ụwa. Ya mere, n’afọ 1978 ha gara asọmpi na Wernbley England ma merie egwu ndị ọzọ si mpaghara ụwa dị iche iche bịa, site n’ịgba ndị nke mbụ, wee buru iko mba ụwa (World Cup) lọta ala Nigeria.
Nke ahụ mere ka a hụtazie ha dịka egwu kacha n’ụwa niile. E wepu Australia, ha agazuola ụwa.
Ọ bụ n’ihi ugo ha tuuru aghara aghara ka e jiri see ha n’akwụkwọ ego Nigeria. I lee anya n’azụ akwụkwọ ego naịra ise (N5), ị ga-ahụ ha.
Nkpọkịtị bụ oke egwu ndị ala anyị ji aga mba.