IGBO sị na ọ na-adị mma ibu ụzọ maa ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, maka na ekwughị ekwu màrà ọnụ, ebe anụghị anụ màrà ntị.
N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalite ịnwụchi ụgbọala na imechi ọdụ ụgbọala dị iche iche na-adịghị erube isi nye iwu ahụ gọọmenti tiri banyere ọrịa nje korona, malite n’izuụka a.
Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Maazị Afam Mbanefo, n’ọgbakọ ya na ndị isi òtù dị iche iche jikọtara ndị na-anyà ụgbọala na steeti ahụ nwèrè n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.
Dịka o siri kọwaa, atụmatụ ọhụụ a bụ nke ọ bụ ndị òtù ahụ na-ahụ maka itinye amụmà iwu korona n’ọrụ na steeti ahụ gà-etinyekwa ya n’ọrụ, ma bụrụkwa nke a ga-ejikwa ụlọikpe ngagharị wee na-etinye n’ọrụ, iji na-ekpe ndị dara iwu ahụ ikpe ozigbo a nwụchiri ha.
Ọ kpọkuru ndị nwere ọdụ ụgbọala dị iche iche na ndị isi òtù jikọtara ndị na-akwọ ụgbọala na steeti ahụ ka ha kụziere ndị òtù ha ihe ha kwesiri ịma banyere nke ahụ nakwa ntaramahụhụ dị iche iche na-echere ndị dara iwu ahụ.
Ọ gakwazịrị n’ihu mee ka a mara na ndị òtù ahụ ga-ekpochapụ ọdụ ụgbọala ọbụla a rụrụ n’ụzọ mkpụke maọbụ ebe ndị ọzọ iwu akwadoghị.