OKE mmiri ozizo nke kpatara iju mmiri (flood), emebiela ụlọ ọnụọgụ ya ruru otu narị, ma chụpụ ihe ruru narị mmadụ atọ n’ụlọ n’okpuru ọchịchị Eket dị na steeti Akwa Ibom.
Maazị Ubong Mark onye bi n’Edem Udom dị n’Eket, oge ọ na-ekwuputa ka o siri me kwuru na ya ataala ahụhụ site n’iju mmiri n’ebe ahụ kemgbe afọ asatọ.
O kwuru sị; “Iju mmiri nke taa dị egwu n’ebe m nọ. Anọ m n’ụlọ na-akwado ịga ụka oge mmiri bidoro batawa n’ụlọ m. Dịka m na-agwa ụnụ ugbu a, atụfuola ọtụtụ ihe m ji biri n’ụlọ dịka akwụkwọ, eletrọniki, akwa, laptọọpụ na ọtụtụ ngwongwo m ndị ọzọ.”
Mark gara n’ihu kwuo na ya bụ ọdachị etinyela ọtụtụ ndị bi ebe ahụ, tinyere ndị nwe ụlọ ahịa (shops) na nsogbu. O kwuru na ngwongwo gburu nde kwuru nde naịra alaala n’iyi n’ihi iju mmiri na-eto n’Eket.
Otu o sila dị, ọ kpọkuru gọọmenti ha ka ọ gbata ọsọ enyemaka.