
NDỊ omeiwu steeti Anambra (agba nke asaa ya) emerùbe mmemme ncheta ọgbụgba otu ahụ ha jiri banye n’ọrụ.
Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ụlọ omeiwu ahụ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e jiri àjà maasị dị asọ wee malite, bụ nke ọ bụ Bishọọpụ ụka Katọliiki na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor nọ n’isi ya.
N’okwu ya na mmemme ahụ, ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kọwapụtara afọ ojuju ya banyere etu ndị omeiwu ahụ sigoro rụọ ọrụ n’ime otu ahọ gara aga n’ihi na ha agharịpụghị steeti ahụ maọbụ ndị ha na-anọchite anya ha n’ụlọ ome iwu ahụ.
Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị iche iche ha mepụtara n’ime otu ahọ gara aga dịka ndị omeiwu, ọ kachasị dịka o siri metụta imepụta atụmatụ iwu bụ ịgbà, ịhụ na ihe na-aga etu o kwesiri n’ọchịchị steeti ahụ, ịnọchite anya ndị ọgbọ nta nkwàdo ha etu o siri kwesi, tinyere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ ha sigoro rụpụta ihe anya na-ahụ; ma kwekwazie nkwà na ha ga-aga n’ihu ịrụ ọrụ etu o siri kwesi, ya na ijikọ aka ọnụ n’ọrụ, ha na isi ọchịchị steeti ahụ.
Na mbụ n’okwuchukwu ya n’àjà maasị ahụ, Bishọọpụ Ezeokafor kelere ndị omeiwu ahụ maka ezi mmekọrịta dị n’etiti ha na isi ọchịchị steeti ahụ, ma kpọkwazie òkù ka ha jigidesie nke ahụ ike n’ihi ụzọ dị iche iche o sigoro nye aka n’ịkwàlite ezi ọchịchị na steeti ahụ.
Ọ dụkwara ndị omeiwu ahụ ka ha gbaa mbọ na-akwalite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya site n’ọrụ ha, ma dụkwa ha ọdụ ka ha na onwe ha bụ ndị gọọmenti gbakwa mbọ na-erube isi nye iwu dị iche iche ha na-eme.
N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kelere ndị omeiwu ahụ ọzọ maka etu ha sigoro rụọ ọrụ ha nakwa ihe dị iche iche ha mepụtagoro n’ime otu ahọ gara aga, ma dụkwazie ha ka mee nke ọma karịa n’ọdịnihu.
Gọvanọ Obianọ jikwara ohere ahụ kpọkuo Ndị Anambra ka ha na-agbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyere banyere ọrịa nje korona, ma na-erubekwa isi nye iwu ọrịa korona, bụ nke ọchịchị ya binyegoro aka ma wàtakwa ọgọdọ itinye ya n’ọrụ n’ozuzu oke, iji belata mgbasa ọrịa ahụ n’ime steeti ahụ.
N’okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado ‘Nnewi South’ nke abụọ n’ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi kpọpụtasịrị ihe dị iche iche o mepụtagoro n’ụlọ omeiwu ahụ n’ime otu ahọ o jiri banye n’ọkwa ahụ, ya na ihe o mepụtagokwaara ndị ọ na-anọchite anya ha n’ụlọ omeiwu ahụ, nke gụnyere ụlọ ahụ ike ọ rụrụ n’Ebenator, bụ nke a ga-agbape n’isi ngwụcha ọnwa a, tinyere ọtụtụ ọrụ mmepe ndị ọzọ.
N’ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbakwara ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado ‘Nnewi North’, bụ Maazị Nonso Okafor, onye nọrọ na nso a wee nyefee ajadụ nwaanyị atọ amụtaghị ụmụ ọmarịcha ụlọ ọhụụ ọ rụụrụ ha na Nnewi, gakwara n’ihu kpọpụtasịa iwu dị iche iche ọ kwàdògoro, ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ rụpụtara n’ime otu ahọ gara aga.
Ha abụọ kwekwwazịrị nkwa ịga n’ihu na-anọchite anya ndị ọgbọ nta nkwado ha nke ọma ma na-arụkwa ọrụ ha nke ọma dịka o siri kwesi n’ụlọ omeiwu ahụ.
N’okwu ọ gwakwara Ka Ọ Dị taa, onye enyemaka pụrụ iche nyegara ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ (bụ Maazị Uche Okafor) n’ihe gbasaara mgbasa ozi usoro ọgbara ọhụụ na ọrụ pụrụ iche, bụ Caleb Okechukwu kelekwara ọkaokwu ahụ, Gọvanọ Obianọ, na ọchịchị steeti Anambra, maka inye ya ọmarịcha ohere dị etu ahụ, ma kwe nkwa ịga n’ihu na-atụnye ụtụ nke ya n’ịkwalite ezi ọchịchị na steeti ahụ, site n’ịrụsi ọrụ ya ike.
A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee bụọ abụ olu ọma dị iche iche site n’aka ndị ọbụ abụ ụka Katọliiki na dayọsiisi ahụ.