NDỊ uweojii kọmandi steeti Imo ekwuputala na ha nwụchikọrọ otu nwaanyị gbara afọ iri abụọ na ise maka ịtapụ amụ di ya. Nwaanyị ahụ kpara arụ ahụ dịka di ya na-arahụ ụra.
Ya bụ ihe nke mere nsonso a n’Umuofuga Umuhu nke dị n’okpuru ọchịchị Aboh Mbise, na steeti Imo ka e kwuru na o nyeghị ndị obodo ahụ ọnụ okwu.
Nwanne (cousin) nwoke ahụ, Udochukwu Nwimo kwuru na enyi nwoke nwaanyị ahụ n’oge gara aga bịara ụbọchị ahụ were ọgbatumtum buru ya pụọ ma bughachie ya azụ na be di ya n’ime abalị. Ozugbo ọ batara ụlọ, di ya onye nke were iwe n’ihi ihe ahụ merenụ jụrụ ya ebe o si, nke ahụ mere na ha bido lụba ọgụ. Udochukwu kwuru na ụfọdụ ndị agbataobi bịara gboo ha ọgụ.
Ọ gara n’ihu kọwaa na ka o ruru n’etiti abalị ha nụrụ oke mkpu nke kpọtere ha n’ụra, ọ bụ otu ahụ ka ha si chọpụta na nwaanyị ahụ atapụla amụ di ya ka ọ na-arahụ ụra. Ha bugara ya ụlọọgwụ n’abalị ahụ.
Dịka o siri kwu, ihe nwoke ahụ jiri bụrụ nwoke nwere ike ọ gaghị arụkwa ọrụ ọzọ n’ihi mmeru ahụ.
Otu o sila dị, ndị ntorobịa iwe na-ewe nke ogbe ahụ hafere nwaanyị ahụ n’aka ndị uweojii, Police Divisional Headquarters, Aboh Mbise.
Dịka DPO bụ Ibiba Thom Manuel si kwu, nwaanyị ahụ nwetakwara mmerụ ahụ site n’ịta arụ (bites), tinyere nnukwu mmeru ahụ dị n’ara ya.
N’akụkụ nke ya, onye kwuputara okwu ndị uweojii kọmandi steeti Imo, Maazị Orlando Ikeokwu kwuru na mgbe a nwụchikọrọ nwaanyị ahụ, na di ya nọ na-ekwu na ya bụ ihe merenụ bụ nsogbu ezinaụlọ (domestic matter) na ha achọghị ndị uweojii na ya bụ okwu, ya mere na ha wepụrụ aka na ya.