MGBE anyị na-ekwu maka nri ndị Igbo o nwere ihe kpatara e ji ekwu ya. Ihe ọbụla a na-eri eri onye Igbo weta ya ọ kwado ya ma sie ya n’udi ọ ga-abụ na i rie ya ụbọchị ọzọ ọ gụọ gị.
Onye Igbo chọọ isi azụ ọ ga-akwadobe ya n’ụdị ọ ga-abụ na i risia ya o ju gị afọ.
Na nri ndị Igbo nke izu a, anyị ga-eleba anya n’otu e si esi ofe akwụ. Akwụ bụkwanụ n’ala anyị ka e si eweta ya. Mpaghara ala Igbo ọbụla na-esi ofe akwụ n’udi nke ha. Nke a bụkwa otu anyị si esi ofe akwụ ahụ, onye ọbụla riri ya ojiri ya mara gị.
Egbutu o isi akwụ, ibute ya, igbọsịa, ifesa ya mmiri, ikpuchie ya abalị abụọ ikpapụtachaa mkpụrụakwụ ahụ. I sachaa mkpụrụakwụ nke ị chọrọ iji sie ofe akwụ nke ọma, isinye ya n’ọkụ, o ghee ị sụọ mkpụrụakwụ n’ikwe.
I ga-eji nwayọọ ka akị dị n’akwụ ahụ ghara ịgbari. I sụchaa ya, I were mmiri dị ńarańara wee fọọ ya nwa oge ka o wee pụta ọma, I wepụ avịrịvọ iche, I wepụ akị iche. Cheta na mgbe ị na-afọ ya mmiri ị ga-agbanye na ya bụ mmiri ị ga-eji sie ya, i were nyọ nwere obere oghere wee zaa ya ka avịrịvọ ghara ịdị na ya. I zanye akwụ ahụ ị gbara n’ite ị ga-eji sie ofe akwụ ahụ, isinye ya n’ọkụ.
Ọsụsie ike i kupụ ụfụfụ dị n’elu ya, ọ bụrụ na akwụ ahụ gbara nnukwu mmanụ ikuputụ mmanụ ahụ. Mgbe ị nọ na-asụ akwụ, i sikọọ anụ ị ga-eji sie ya debe.
Ka i kupuchara ụfụfụ ahụ, i tinye okporoko ikpuchie ya, okporoko ghee itinyezie azụ mkpọ, ịra, okpenyi, magị, ose, nnu, I sụọ yabaasị tinye, ikpuchie ya. Ihe ndị ahụ I tinyere ghee I tinye akwụkwọ nchụnwụ na akwụkwọ ụgụ, I kpuchie ya, obere oge ị fọtuo ya.
E ji ofe akwụ eri osikapa, e ji ya elo akpụ, garị nakwa nri ọbụla e sere ese.