A KỌWAALA mkpa ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafo steeti Anambra bi na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria nakwa mba ofesi ga na-erube isi nye ọkpụkpọ oku Akụ Ruo Ụlọ ahụ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ, site n’ịdị na-ewelataru àkụ ya ụlọO
ku a bụ nke a kpọnwòrò ọzọ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra site n’ọnụ osote Gọvanọ steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke n’okwu ya oge ọ gara ileta ka ọrụ si aga n’ihu ọrụ ‘Awka Millennium City Estate’, bụ ebe a na-arụ ụlọ obibi esteeti nakwa ihe ọgbara ọhụụ ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka, na-akwalite ọnọdọ obibi ndụ na na ọnọdụ mmepe n’izugbe.
Ọrụ ngo ahụ bụ nke a na-arụ site na njikọ aka gọọmenti steeti ahụ na otu ụlọọrụ nnọrọonwe a maara dịka ‘M-P Infrastructure’ n’okpuru atụmatụ ‘Public-Private Partnership’ ma bụrụkwa nke a na-arụ na mpaghara Agụ Awka.
N’okwu ya n’ebe ahụ, Dọkịta Okeke kọwapụtara afọ ojuju ya banye etu na ogoogo ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma kelekwa ụlọọrụ ji ọrụ ahụ maka agbambọ ha.
Dịka ọ na-eme ka a mara na ọchịchị steeti ahụ emezuola nke ya, ọ dụkwazịrị ụlọọrụ ahụ ka ha gba mbọ mezùpụta akụkụ nke ha dịka o siri dị n’akwụkwọ nkwekọrịta ha na gọọmenti steeti ahụ binyere aka na ya maka ya bụ ọrụ.
O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ndị Anambra ka ha na-ewelataru àkụ ha ụlọ ma na-ewunyesi ihe mwunye, ụlọọrụ nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ, n’ihi na nke ahụ abụghị naanị na ọ ga-enye aka ikewàpụrara ụmụnne ha bụ Ndị Anambra ohere ọrụ, kama ọ ga-enyekwa aka n’ụzọ pụrụ iche n’ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ nakwa ego na-abata n’ime ya, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ dị iche iche ga-esi na nke ahụ pụta.
Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Investment Promotion and Protection Agency (ANSIPPA)’ bụ Maazị Jide Ikeakor, onye ọ bụ ya na-anọchite anya steeti ahụ n’ọrụ ngo ahụ, mekwazịrị ka a mara na steeti Anambra enweela ezi ọnọdụ gburugburu na nchekwa bụ ịgbà maka ndị oji ego achụ ego ịbịa wunye ihe na steeti ahụ, ma kpọkukwazie Ndị Anambra ka ha welataruo àkụ ha ụlọ, n’ịgbasò ọkpụkpọ oku Akụ Ruo Ụlọ.
Ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ soro Dọkịta Okeke wee gaa njem nleta ahụ gụnyèrè Kọmishọna na-ahụ maka ala, bụ Maazị Bonaventure Enemali; onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ, bụ Maazị Primus Odili; Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor; ògbò ya nke na-ahụ maka njem okporo ụzọ, bụ Maazị Afam Mbanefo, tinyere onyeisi ụlọọrụ ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’, bụ Maazị Amaechi Okwuosa, na ụfọdụ ndị ọzọ.