Ị dakpo ụmụnwaanyị ma kwaa ha iko n’ike bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ụwa niile gbaa gburugburu ugbu a. Ọ bụghị sọ na a na-eme nke a, ụfọdụ n’ime ha ka a na-egbu egbu. Nke a bụ nnọọ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi. Gọọmenti mba dị iche iche na-agba mbọ n’elu na ala iji hụ na e gbochiri ya bụ ajọ ọnọdụ mana a na-ekwu ndị mere eme, a na-eme ya na-agawanye n’ihu. Dịka ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-akatọ arụrụala a, onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ọtụtụ ajụjụ ọnụ banyere ya:
REV Adaobi – Nke a bụ njirimara ọgwụgwụ oge. Ndị mmadụ enwezighị egwu Chineke nke ha na-asọpụrụ njirimara ha. Ụmụ ụwa na-ańụ ọgwụ ike aghara aghara ma na-abakwa otu nzuzo dị iche iche nke na-etinye ha n’ime ihe ala na-asọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na ụzọ e si a zụlite ụmụaka dị nnukwu mkpa.
Ekwesịghị inye ụmụaka ohere ka ha na-eme ihe sọrọ ha.Umụaka na-elelezi ihe ọjọọ dị iche iche n’onyoonyoo dịka ndị gba ọtọ.Ha jizi ekwentị eme ihe dị ha mma. Egwu dị. N’oge mbụ, ọbụghị sọ nne na nna na-azụ nwa makana nwa bụ nke ọha.
Okenye hụ nwata ebe ọ na-eme ihe ọjọọ o nye aka kụziere ya, ọ bụrụ nke ọ ga-enye ya ntaramahụhụ, o nye ya. Ma taa, onye hụ ebe nwata na-ala n’iyi ọ gbachi nkịtị, ọ gaghị atụpụ ọnụ n’ihi na ọ maghị nke ọ ga-ekwu tinye onwe ya n’okwu na ụka.
Nke a so n’ihe kpatara oke nsogbu dị n’ụwa taa. Ọha mmadụ kwesịrị itinye aka gbaziere ụmụ na-eto eto. Gọọmenti kwesịrị ị na-enye onye ọbụla kpara agwa ọjọọ dị otu ahụ ntaramahụhụ dị egwu iji wee kụziere ndị ọzọ ihe.
Uzoma – Ọtụtụ ụmụnwoke na-enwe oke mmasị ikwa iko. N’ihi ya ha na-eche echiche arụrụala ma na-elekwa nwaanyị anya arụrụala mgbe niile. Ọ bụ ya na-etinyekarị ha n’ịdakpo nwaanyị, kwaa ya iko n’ike. Ọ bụ nke ahụ mere na otu onye ode akwụkwọ ji kwuo na onweghị ihe kwụ amụ aghaghị nzuzu.
Ọzọ dị ka ibe ya bụ na nne na nna kwesịrị ị na-akụzịrị ụmụ ha ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị (sex education) n’ihi na ọ ga-enye aka imepe ha anya n’oge ịmata ụzọ dị iche iche ha ga-esi wee zeere ọnwụnwa dị otu ahụ.
Nne na nna ekwesịghị ịnọ n’ihu ụmụ ha na-enwe mmekọ di na nwunye. Mgbe ụfọdụ ka a na-eche na ụmụaka amaghị ihe ha na-eme ma e mechaa ụmụaka ahụ apụọ mebe ihe ha hụrụ nne na nna ha na-eme. Ihe ndị a niile socha n’ihe na-etinye nwoke n’idakpo nwaanyị n’ike. N’ikpeazụ, mmadụ kwesịrị ijikwata onwe ya nke bekee kpọrọ ‘self control’.
Okafor – Ị dakpo nwaanyị n’ike bụzị ụkwa a chị n’aka ugbu a makana a na-anuzị akụkọ banyere ya kwa ụbọchị. Ihe na-akpata ya si n’aka nwoke, nwaanyị tinyere ezinaụlọ. Ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ejikwatanwu onwe ha n’ihi ihe ha na-ahụ, ebe ụfọdụ bụ na ọ marala ha ahụ ịma nwaanyị elu n’ike. Amaghị m ihe ga-etinye nwaokorobịa n’ịga kwaa agadị nwaanyị iko n’ike. Olee ihe o ritere n’ụdị arụrụala dị otu ahụ?
Ọzọ bụ na ejiji ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eji n’oge ugbu a so etinye nwoke n’ọnwụnwa ịdakpọ ha n’ike n’ihi na e kwuru okwu sị na onye mee onwe ya oke a ghọrọ nwamba chụba ya. Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agbazi ọtọ aga n’okporoụzọ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ na nne na nna ụfọdụ anaghị ebido n’oge elebara ụmụ ha anya. Ụmụaka ọbụla ruru afọ iri na abụọ wee gbagobe ekwesizịghị irahụkọta n’otu ebe; yaabụ nwoke na nwaanyị. Nwoke ekwesighị ịsa nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwaanyị ịsa nwoke makana ụmụaka na-esi n’ụzọ dị otu ahụ amụta arụrụala. Ekwenti sokwa n’ụzọ ọzọ ha si amụta ihe ọjọọ n’ihi ụdịrị onyoonyoo ha na-elele.
Ihe ndị ọzọ na-akpata ajọ ihe niile a bụ ịńụ ọgwụ ike, ịńụ mmanya na-aba n’anya, ịkwụ ajọ nkwụ na amaghị Chineke. Onye ma Chineke agaghị eme ihe ọjọọ dị otu ahụ.
Onye achọghị ka a kpọọ aha ya – Ịdakpo nwaanyị kwaa ya iko n’ike dị n’ụzọ dị iche iche. Nwoke na-agwa nwaanyị ka o nye ya onwe ya tupu o nyere ya aka wee chọta ọrụ na-akwa nwaanyị iko n’ike.
Ndị ọzọ gụnyere ụfọdụ ndị nkuzị ụlọakwụkwọ dị elu na-akwanye ụmụakwụkwọ ime otu ahụ ka ha wee gafee n’ule, ndị pastọ adigboroja na-esite na ha na-ekpere nwaanyị ekpere mee otu ihe ọjọọ ahụ, ndị enyi di mmadụ na-esi n’ụzọ inyere nwunye enyi ha nwoke aka dinaa ha, ndị na-arafu ụmụaka ma site n’imere ha amara dinaa ha.
Ndị niile na-esi n’ụzọ aghụghọ manye nwaanyị idina ha na-adakpo nwaanyị n’ike n’ihi na ọ bụghị uche nwaanyị ahụ ime otu ahụ.
Uzonicha – Ịdakpo mmadụ n’ike dị n’ụzọ dị iche iche. Ihe na-akpata ya si n’aka nne na nna, ndị odibo, ndị nkuzi na ezinaụlọ (extended family). Ọ bụrụ na nwaanyị alụgharịa dị wee kpọrọ nwa ya nwaanyị laa n’ụlọ di ya nke ọhụrụ onye arụrụala nọ n’ezinaụlọ ahụ nwere ike ịdakpo nwata ahụ, ọ ga-eme nwa ahụ ka ọ hapụ ịgwa mmadụ ihe ọjọọ ahụ site n’iyi ya egwu n’ụzọ dị iche iche.
Ọzọ bụ na ọtụtụ nne na nna na-ahapụrụ ndị odibo ka ha na-elekọtara ha ụmụ ha. N’ime otu ọnwa ha na ụmụ ha anaghị anọkọ, ọ bụ sọọsọ odibo ka ha na ụmụaka ahụ na-anọ oge niile. N’ụzọ dị otu ahụ odibo nwoke nwere ike dakpoo nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ebe odibo nwaanyị nwekwara ike mee otu ahụ.
Ọ bụghị so nwoke na-eme ndakpo, nwaanyị na-emekwa ya, ọ bụrụ na nwaanyị dakpoo nwoke anaghị ahụ njirimara ya dịka ọ na-esi apụta ihe n’ebe nke nwaanyị nọ. Ndị odibo na-arafụ ụmụaka ahụ site n’inye ha onyinye, ebe ụfọdụ na-eyikwa ha egwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe na-emenụ.
Ọzọ dịkwa ka be ya bụ na ọtụtụ nne na nna na-ahapụrụ ndị nkuzi ọrụ ha kwesịrị irụ n’isi ụmụ ha nke mere na ụmụaka na-atụzị ndịnkuzi egwu karịa nne na nna ha. Nke a mere na ndịnkuzi na-adakpozi ụmụakwụkwọ.
Onyenkuzi nwoke nwere ike ịdakpo nwatakwụkwọ nwoke ebe nke nwaanyị nwere ike ịdakpokwa nwaakwụkwọ nwaanyị. Ya bụ ihe na-etinye ụmụakwụkwọ e mere ụdị ihe ahụ n’rọ onwe ha oge niile, ọ gaghị na-achọkwa mmekọ mmadụ. A bịakwa n’ime ezinaụlọ, nne na nna na-enwe ezi ntụkwasi obi n’ebe onye ezinaụlọ ha ọbụla nọ, ma okwesighị ịdị otu ahụ.
Ọbụladị na ha hụrụ ihe ha ga-enye enyo, echiche ha anaghị eru na ya n’ihi oke ntụkwasi obi. Ha nwere ike hụ ebe okenye na-amị nwa ha ọnụ ha agaghị ekwu okwu n’ihi na echiche ha erughị na ihe ọjọọ nwere ike isi otu ahụ dapụta.
Ọ bụghị sọ ụmụnwoke na-eme ndakpo n’ike, ụmụnwaanyị na-emekwa otu ahụ, ya mere ndị mmadụ kwesịrị ihi asaa n’anya.
Christabel – Nne na nna, tinyekwara ndị ụka kwesịrị ịdị na-enye ụmụaka nkuzi banyere mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Nke a ga-eme ka ụmụaka kee nkwụcha ma chọpụta n’oge, ihe gbasara ya. Ọzọ bụ na ụmụaka na-esi n’ekwenti amụta ihe ọjọọ dị iche iche. E kwesighị inye nwa erubeghị afọ iri na asatọ nnukwu ekwenti. Nne na nna kwesịkwara ịbịa ụmụ ha nso nke ga-eme ka ụmụaka ghara ị na-asọ ha asọ.
Ọ bụrụ na nne na nna na-emeso ụmụ ha nke ọma ghara ịdị na-agbọ ha oke ụja ụmụaka ga na-agwa ha ihe dịka ha sịrị hụ ya. Nne na nna kwụsị iyinye ụmụ ha akwa enweghị isi na ọdụ n’ihi na nwata ahụ too, o were otu aka ahụ na-aga, ọ pụzie ọ gbara ọtọ na-aga n’ụzọ.
Oke ndakpo a na-adakpo ụmụnwaanyị n’ụwa taa si n’aka nne na nna n’ihi na ha anaghị emetacha ihe ha kwesịrị ime. N’ikpeazụ, a nọzị n’ọgwụgwụ oge, o so n’ihe arụ a ji eme n’elu ụwa taa.
Nnedi Michael – Ọ karịana, akụkọ ịkwa nwaanyị iko n’ike bụzị chi fo a nụ ọzọ. Ụmụnwaanyị ụnụ agazine ije abalị, otu onye agazine ebe mmadụ anọghị, ụnụ chọọ ịga n’ugbo ma ọ bụ ebe dị aghaa ụnụ kwụrụ n’igwe. A na-adakpozi ụmụaka dị ọnwa olemole, ndị otu afọ were gaba, ya mere ụmụnwaanyị keenụ nkwụcha.
Ụnụ ekwezine ka ụmụnwoke kuru nwa ụnụ nwaanyị ebe nwata ahụ gba ọtọ. Ọtụtụ ụmụnwoke na-akpa agwa ka anụ ọhịa, ha hụ nwata nwaanyị gbara afọ ise amụ ha a kwụrụ ọtọ. Yichibenụ ụmụaka nwaanyị ahụ nke ọma makana ha ejighị amụ mee ha were aka. Ụmụagboghọ yibenụ akwa dị mma ga-ekpuchite ụnụ nke ọma. Ụmụnwoke chịkọtanụ onwe ụnụ.
O nwere uru dị n’ịkwa nwaanyị iko n’ike? Onweghị mkpori ndụ dị na ya. Ị ma ọnọdụ ahụike nwaanyị ahụ? Ịmaghị ma ọ bu oberenajaọcha (HIV) ma ọ bụ ọrịa ọjọọ ndị ọzọ.
Victoria – Ọtụtụ ụmụnwoke na-adakpo nwaanyị n’ike bụ ndị jị ọnọdụ ahụ na ihe so ya agwọ ọgwụ (ritualists). Ha na-eji ihe si n’ahụ nwaanyị pụta were agwọ ọgwụ. Ụfọdụ bụkwa ndị chọrọ ka ha na nwaanyị nwee mmekọ nwaanyị ahụ ajụ, iji wee megidezi ya ha na-aga kwaa ya iko n’ike ma gbukwaa ya ka ọ ghara ịgba ha ama.
Onye achọghị ka a kpọọ aha ya – Ịgwọ ọgwọ ọjọọ so n’ihe na-etinye ọtụtụ ụmụnwoke ịdakpo nwaanyị, tinyekwara iso n’otu nzuzo. Ọzọ bụ na e nwere ike ime mmadụ merekwe jebe n’ihi agwa ọjọọ ọ kpara n’oge gara aga. E nwekwara ike ime mmadụ ka ọ na-akpa agwa ọjọọ dị otu ahụ iji wee menye nne na nna mụrụ ya ihere, ka nwa ha ghara inwe ezi odinihu.
Ike Simon – Ịnọ nkịtị so n’ihe na-etinye ọtụtụ ụmụnwoke n’ihe ọjọọ dị otu ahụ n’ihi na mgbe mmadụ nwere ihe ọ na-eme ọ gaghị enwe ohere iche echiche ọjọọ. Ọnọdụ ịnọ n’ụlọ n’ihi nsogbu korona so n’ihe kpatara ya.
Abụmọnụ nke ezinaụlọ (family curse) sokwa n’ihe na-etinye ndị mmadụ ịkpa ụdị agwa ọjọọ a. Ya mere, gọọmentị kwesịrị ịhọpụta ndị ọ ga-abụ ọrụ ha ịhụ ihe banyere ajọ ọnọdụ a, ka a ghara ịhapụrụ sọ ndị uweojii ka ha na-ahụ ihe banyere ya.
Amina – Isi adịghị ndị na-adakpo nwaanyị mma. E jide ha, oke tapụ ha amụ. Ụbọchị gara aga ka otu nwaanyị na nwa ya agbabeghị otu afọ dina ala n’ụlọ ha.
A nọkata ọ hụzighị nwa ya e wee bido chọba ya, n’echi ya ka a hụziri ozu nwata ahụ; a kwaala ya iko n’ike, ọ bụzi onye nwụrụ anwụ. Ekwesighị ịhapụ ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ndụ, si bepụ ha amụ ozugbo.
Uchenna – Ụmụnwaanyị eburula ụzọ kwaa onwe ha iko n’ike site n’ụdị akwa ha na-eyi. Ụwa adịgo ka ọ ga-adị.
Ndị ọzọ gụnyere Ego na Chidi kwuru na ị nọ ńkịtị so n’ihe na-akpata ndakpo, ma kpọọ oku ka gọọmenti nye ndị mmadụ ọrụ n’ihi na onye enweghị ihe ọ na-eme na-enwekarị efe ime ihe ọjọọ.