ỊNYA ọkụ bụ ihe e jiri mara ndị lgbo n’oge gboo. Ha na-eme nke a n’oge oyi ọtụtụ dịka ụgụrụ na udu mmiri.
N’ihi ya, nkụ gbara ọkpụrụkpụ anaghị akọ ha n’ụlọ. A nọ na mbara anya ọkụ nọrọkwa n’ime ụlọ, dịka oge siri dị. Ịnya ọkụ na-eme ka ahụ gbasie ma okenye ma ụmụaka ike. Oge ụfọdụ, a na-anọ ebe a na-anya ọkụ na-akọrọ ụmụaka akụkọ ifo.Ọnọdụ ịnya ọkụ na-eme ka ezinaụlọ na-ankọ ọnụ.
Ịnya ọkụ na-enyere ndị agadi aka n’ihi na ọ na-eme ka ahụ gbasie ha ike. Ọ na-enyekwara ụmụaka aka ka oyi ghara ịba ha ahụ.
Oge ụfọdụ ọkacha n’oge ụgụrụ a na-akwanye ọkụ n’ama, onye gafete ọ nyara ọkụ. Ịnya ọkụ na-eme ndị Igbo obi ụtọ.