ÒTÙ isi ọchịchị obodo Nkpọr a maara dịka ‘Nkpor Development Union’ nọrọ na nso-nso a wee kesaara ụfọdụ ndị òtù ha bụ ụmụafọ Nkpọr ọnọdụ dịịrị añaa ihe erimeri dị iche iche, iji mee ka ha ka nwee ihe oriri n’ime oge a ọrịa korona na-enye nsogbu ma na-emekpàkwa ụwa ahụ n’ọtụtụ ụzọ.
Erimeri ahụ e kesàrà gụnyèrè àkpà osikapa karịrị narị asaa, ya na nri olilo Semovita, na puku naịr ise a tụkwasara n’elu ya, ma bụrụkwa nke ndị dị iche iche si n’ime ógbè iri e nwere n’obodo ahụ. Ndị ajadụ na ụfọdụ ndị ọzọ ihe na-esiri ike so na ndị ritara úrù n’erimeri ahụ e kesàrà.
N’okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-ekesàra ha ihe oriri ahụ, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Innocent Mbagha kọwara na ebumnobi ha jiri bute ma kèsàá ihe ahụ bụ iji bèlatara ndị ahụ ritara úrù na ya ihe isi ike dị n’oge a, n’ihi na ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọnọdụ amaghịzị kwụrụ ugbu a n’ihi ọrịa korona.
O kelere ndị obodo Nkpọr, ma ọnọ n’ụlọ ma ọnọ n’ụzọ ije, maka ịtụkọta ihe oriri na ego ahụ e kesàrà, ma dụọ ha ọdụ ka ha jisie ike n’ọrụ.
Maazị Mbagha nọkwazịrị n’ebe ahụ wee kpọọ òkù ma dụọ ụmụafọ obodo ahụ ọrụ ka ha na-erube isi n’ozuzu oke nye ntụziaka niile gọọmenti nyere nà iwu niile o tìrì gbasaara ọrịa korona, n’ihi na onye ọbụla kwesìri iso inye aka n’ụzọ nke ya, iji chụọ ọrịa ahụ ọsọ.
Na ntụnye nke ya, onyeisi oche òtù ọrụ na-ahụ maka ihe enyemaka a tụkọtara n’ihi ọrịa korona n’obodo ahụ, bụ Maazị Pius Udoh, bụkwa onye Klaakị ụlọomeiwu steeti Anambra, mèrèkwara ka a mara na ha hiri asaa n’anya wee họpụtasịa ndị ga-eso rita urù n’erimeri ahụ e butere.
O nyere owuweanya na a ga-ekesà erimeri ahụ etu o siri kwesi ma kwe nkwa na ha na-atụkwa anya ime ihe ahụ ọzọ n’ọdịnihu iji mee ka ndị esoghị rita uru n’agba nke mbụ a soro rita uru na nke ahụ.
N’okwu ya igosipụta ka obi dị ya, otu onye n’ime ndị dị iche iche soro keta erimeri ahụ, bụ Oriakụ Patricia Okonkwo kelere Chneke, isi ọchịchị obodo ahụ nakwa ndị niile tụnyere ụtụ n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ime ka ụbọchị ahụ gaa siriri-werere.
Ya bụ mmemme dọtara ụfọdụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na Nkpọr.