AKA ndị uweojii na steeti Anambra akparala ótù nwoke izu ohi dòrò anya, bụ Maazị Chibuzor Nwachukwu Emmanuel (gbara ahọ iri abụọ na anọ), maka ịma aja ngwùrù wee ga zuru Keke mmadụ.
Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed kwupụtara nke a site n’ozi ọ kụpụrụ na nso-nso a banyere nke ahụ.
Dịka o siri kọwaa, nwata nwoke ahụ, bụ onye obodo Ọkpụnọ Ochie dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’ na steeti Anambra, màrà aja, wee gaa izuru Keke Maazị Okafor Chukwunonso Kelvin n’ime ngwùrù be ya dị n’Ụmụdioka n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’ ahụ, aka wee kpàra ya.
O mere ka a mara na ọ bụ oge o jiri ọkàrà gata elekere isii nke ọnụ ụtụtụ ụbọchị Satọdee ka ha nwụchiri ya bụ nwaokorobịa oge ha nwetàrà ozi bànyere akụmakụ ahụ.
Otu ọ dị, ya bụ nwata nwoke ewerela ọnụ ya sàá asịsà na ya mere ihe dị etu ahụ n’ezie. A napụtazịkwara ya Keke ahụ, ma na-emekwuzị ụmụ nnyòcha olenaole, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee kwụọ ya ụgwọ ihe o mere.