NA nri ndị Igbo nke izu a anyị ga-eje steeti Abia. Anyị ga-esi ofe achara. Ụfọdụ ga-asị gịnị bụ ofe achara ebe ụfọdụ ga-asịkwa gịnị bụ achara ma ọ bụ a na-eri achara eri?
Otu a ka e si akwado nakwa ka e si esi ofe achara. E mechaa ị ga-ahụ na ofe achara na-atọ ụtọ. Ị ga-ebu ụzọ kwadochaa ihe niile ị ga-eji sie ofe achara tutu ibido isi ya.
Ị gaa ugbo, I weta achara ma ọ bụ igota achara n’ahịa, ị bata ị wepụsịa azụ achara nke siri ike ruo n’etiti ya, ị ga-ahụ nke esighị ike, nke ahụ ka ị ga-ewepụta ị ga-eji sie ofe.
I wepụchaa ole ị ga-eji sie ofe, ị malite ịgbaji ya kịrịkịrị, ị gbajichaa ya ị debe ya. Ị kwọọ egwusi, ị wunye egwusi ahụ ị kwọrọ n’ikwe, tinye obere mmiri na ya, ị sụkọọ ya nke ọma, ị malite ịkpụ egwusi ahụ kịrịkịrị.
Ị kpụchaa egwusi ahụ i debe. I sinye anụ, ọ bụghị sọọsọ anụ ehi, ị chọọ ị were anụ ewu, ọkụkụ, nchi, i sikọọ ya na okporoko. Ị wụpụ ya debe, ị gbanyezie mmiri ị ga-eji sie ofe n’ite sinye n’ọkụ. Mmiri ahụ gbọọ ị wụnye egwusi ahụ ị kpụrụ sibe ya, ị gaghị ekwe ka ọ gbarie makana ụtọ ofe achara bụ kịrịkịrị egwusi ahụ ị ga na-ahụ ma ị na-eri ya.
Ị ga-edebekwa egwusi akpụghị akpụ ị ga-eji rọọ ofe. Ma ọ bụrụ na egwusi ị nwere ebụghị ibu iwere achị na ọsụ rọọ ya. Ọ bụrụ na nke ahụ ị kpụrụ akpụ ghee, ị mara na mmiri ofe dị n’ọkụ ọ ga-ezu iji sitọpụ ofe, ọ bụrụ na ọgaghị ezu, ị gbanye mmiri ga-ezu ọ gbọọ ị wunye egwusi ahụ ị kpụghị akpụ, ọ bụrụ achị ka ị ga-eji rọo ofe, ị were mmanụ gbarie achị ahụ ị wunye ya na mmiri ofe ahụ dị n’ọkụ, tịnyezie nnu, ose, dawadawa ma ọ bụ okpenyi, azụ mkpọ, magị na ịra. I kpụchie ya o ghee ị wunye anụ na okporoko i sikọrọ, ọ sụkọọ nke ọma i lee ma nnu ọ I kpuchie ya, nwa obere oge ị fọtuo ya.
I werezie akpụ a sụrụ nke ọma, nri ji, nri e sere ese ma ọ bụ garị ribezie ofe achara gị.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ, nri ndị Igbo atọka.