ỤLỌỌRỤ na-ahazi ule e ji abanye n’ụlọakwụkọ dị elu n’ala anyị bụ Nigeria The Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ewepụtala aha ndị mere nke ọma n’ule nke afọ a bụ 2020.Mmadụ iri mere nka ọma karia tuuru ugo site n’inweta akara 352 ruo 365.
Onye gbara onye nke mbụ bụ onye steeti Anambra ebe onye nke abụọ bụkwazi onye Anambra. Maduafokwa Egoagwụagwụ Agnes gbara onye nke mbụ site n’inweta akara (score) dị 365 ebe Nwobi Okwuchukwu David gbara onye nke abụọ site n’inweta akara 363.
Nwaada Mmadufokwa, onye Ihialla nke dị n’okpuru ọchịchị Ihialla na steeti Anambra tinyere ihe ọmụmụ Industrial Chemical Production na mahadum University of Ibadan ebe Nwobi Okwuchukwu David tinyere ohe ọmụmụ Mechanical Engineering na Kwara State University.
N’ihi nke a aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano ekpebiela ikele ụmụ Anambra abụọ a maka ugo mmụta nke ha tulatara. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkọwara ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma na steeti ahụ bụ C. Don Adinuba n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ kuru na gọọmenti nwere nnukwu ọṅụ n’ihi ugo ọma nke ụmụ Anambra na etute n’ụwa niile oge ọbụla.Ọ kọwara na Gọvanọ Obiano ekwuputala ịnabata ma kelee ụmụka ahụ na nne na nna ha oge adịghị anya.
Kọmishọna Adinuba kwuru sị: “Nturuugo nke Egoagwuagwu na Nwobi dịka ndị mekarịchara nke ọma n’ule JAMB nke afọ 2020 bụ usoro na njirimara ihe ọma nke e jiri mara ịdị Anambra”
Ọkammụta Kate Omenugha bụ Kọmishọna na-ahụ maka mmụta(Basic Education) na streeti ahụ kwuru sị na ọtụghị ya n’anya na Gọvanọ Obiano chọrọ ikele ụmụaka abụọ ndị Anambra ahụ mekarịchara nke ọma n’ule JAMB n’ihi na ọ dị mbụ eme nke ọma. Ọ kọwara na ọ na-eme nke ahu mgbe niile dịka ọtụtụ ụmụ Anambra tulatarala ugo n’oge gara aga.