ÒTÙ nnọrọonwe a maara dịka MUNA Foundation’ n’aha bekee akwàdola ndebànye aha ndị mmadụ ruru iri ise n’ọnụọgụgụ n’akwụkwọ atụmatụ nchekwa ahụ ike ‘Anambra State Health Insurance Agency’ bụ ‘ASHIA’, ka ha wee so rita urù n’atụmatụ nchekwa ahụ ike ahụ.
Mmadụ iri ise ndị ahụ e debànyere aha ha n’akwụkwọ atụmatụ nchekwa ahụ ike bụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị obodo Ịgbakwụ dị n’okpuru ọchịchị Ayamelụm n’me steeti Anambra. Mmemme idebanye aha ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Ịgbakwụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ya, ọkachasị ndị nne na na nna.
N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ASHIA, bụ Dọkịta Simeon kọwara atụmatụ ahụ ike ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma bụrụkwa nke mịtagoro ọtụtụ mkpụrụ ọma dị iche iche n’ihe metụtara ịkwalite ezi ọọdụ akụ ike ụmụafọ steeti ahụ.
O kelekwara ma kwupùru òtù MUNA ahụ maka ịghọta mkpa ọ dị idebanyere ndị ahụ aha n’akwụkwọ ka ha wee soro rita urù n’atụmatụ ahụ, ọbụnadị dịka o jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị maọbụ òtù dị iche iche bụ ndị aka ji akụ maọbụ na steeti ahụ ka ha ñomie ọmarịcha ọrụ ahụ ma mekwara ndị agbatobi ha na ndị obodo ha ihe etụ ahụ.
Oge ọ na-akọwa ọtụtụ uru dị iche iche dị na mmadụ idebànyè aha n’usoro amụmà nchekwa ahụ ike ahụ, ọ mere ka a mara na ọ bụ ọchịchọ óbì Gọvanọ Willie Obianọ ịhụ na mmadụ ọbụla na ezinaụlọ ọbụla dị na steeti ahụ ga-esonye n’amụmà ahụ, bụzị nke mere ọchịchị o jiri guzobe ma na-etinye ọkpụrụkpụ ego n’ịkwàdo ya bụ atụmatụ nchekwa ahụ ike n’ọnụ ego dịkarịchara àlà.
Ọ kọwakwara etu atụmatụ ahụ si arụ ọrụ; ma mekwa ka a mara na e nwèrè ụlọ ahụike ruru narị abụọ na iri isii na atọ na-esonye n’imezùpụtà na itinye atụmatụ ahụ n’ọrụ.