GỌỌMENTI steeti Anambra ekwupụtala mkpebi na amụmà ya itegharị elu àkwà mmiri Ọbịbịa dị n’okporo ụzọ ahụ siri Ọkpụnọ gaa Isuanaọcha, n’okpuru ọchịchị ime obodo Awka North.
Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor, oge ọ gara ileta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’elu àkwà ahụ, bụ ebe mebisiri emebi ma malitekwa inwegasị oghere kemgbe udummiri jiri malite.
Maazị Ifejiọfọr mere ka a mara na ya ezipụbụọla ndị ọrụ injinia ka ha ga leta ka ọnọdụ siri dị n’àkwà mmiri ahụ, bụkwa ndị gachaara ma laghachi, kọwaara ya na àkwà mmiri ahụ ka siri ike ma kwụrụkwa chịm.
O kwuru na ya onwe ya ewerekwala ụkwụ ya ga ha, ma chọpụta na ya bụ àkwà ka dị ndụ, naanị na idè mmiri zoro ezo si n’Ọkpụnọ na-ehudàta ma na-adọrọzị n’elu ya bụ àkwà, n’ihi na ndị mmadụ ejirila atịtị suchisie ebe ya bụ mmiri kwesiri isi na-aga.
Ọ katọrọ etu ụfọdụ ndị mmadụ siri werezie àkwà mmiri ahụ na gburugburu ya mere ebe a na-ekpofù ahịhịa. O kwezịrị nkwà na gọọmenti ga-ehekèpusi mgba korota ochie e tere n’ụzọ ahụ ma tegharịa ya nke ọhụụ, iji belata ihe nhịa ahụ ndị mmadụ na-agabiga na mpaghara ahụ ma ha na-agafe ebe ahụ, ọkachasị ma mmiri zòó.