O PEKATA mpe mmadụ iri atọ ji ahụ ha akpa ego (sex workers) abụrụla ndị nọ n’enwezighi ebe obibi ugbu a dịka ọkụ gbariri ụlọ ebe obibi ha. Nke ahụ dapụtara na Mile 2 dị na Port Harcourt, steeti Rivers.
Ọkụ ọgbụgba ahụ ka e kwuru na ọ malitere site n’aka onye na-esi nri ahịa wee gbasazie.
Otu onye nọ mgbe ọkụ ahụ na-agba kwuru na ihe karịrị ọnụụlọ iri abụọ nke ndị ashawo ka ọkụ ahụ gbariri. Otu o sila dị, o kwukwara na atụfughị ndụ ọbụla na ya.
O kwuru sị; “Ọkụ ọgbụgba ahụ malitere site n’ite otu onye na-esi nri n’ihu ụlọ ndị ashawo ahụ n’ihe dịka elekere asatọ nke ụtụtụ. Dịka ọ na-eghe mmanụ, ite ya nwuuru ọkụ wee bigbọọ.
Ụfọdụ ndị ntorobịa n’ogbe ahụ gbalịrị imenyụ ọkụ ahụ ma o kweghị ha emenyụ. Ọtụtụ oku a kpọrọ ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ (state fire service) e nweghị isi ihe karịrị awa atọ, wee ruo na ọkụ agbaa ụlọ ahụ gwoogwoo.”
Otu o sila dị, onye nwe ụlọ ahụ gbara ọkụ (director) Prince Ihunwo kpọrọ oku ka a gbatara ya ọsọ enyemaka dịka ọkụ gbagworo ihe niile o nwere.