Egwu Ekpiri ka na-agakwa n’ihu

0
117

NKE a bụ izu nke atọ anyị jiri malite ikwuputa maka egwu ekpiri (highlife music). Ọtụtụ ụmụ Igbo chawapụrụ n’egwu ekpiri, nke mere na anyi ka na-aga n’ihu n’ịgba ha n’anwụ.

  Ya mere, anyị ga-akọwapụta maka King Chief Oliver De Coque (Onye a mụrụ dịka Oliver Sunday Akanite).

   A mụrụ ya ka ọnwa Epure dị n’abalị iri na anọ n’afọ 1947. Ọ bụ onye Ezinifite nke dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South, na steeti Anambra. Ọ kụrụ egwu site n’afọ 1965 wee ruo 2008. Ọ na-agụ egwu ma na-akpọkwa jita  n’ụzọ dị egwu. Kemgbe ọ kụchara egwu ya bụ Messiah Messiah n’afọ 1977, ọ kụpụtaara ụwa egwu ruru iri iteghete na atọ.Egwu ya wuru ewu ma gazuo mba ụwa. Ha gụnyere: Biri ka m biri, Nwanne dị na mba, Ụwa bụ aja, 10th anniversary Peoples Club of Nigeria, Nnata Chief Emeka Odumegwu Ojukwu w.d.g.

  Oliver De Coque nwụrụ ka ọnwa Juunu dị n’abalị iri abụọ n’afọ 2008 n’ụlọọgwụ R Jolad Hospital, Lagos.

GUO:  Egwu ndị Igbo: Egwu Ekpiri

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here