…ụgbọala nsọnyụ ọkụ

0
78

ISI ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ala Nigeria a maara dịka ‘Feredal Fire Service’ nọrọ na n’ọdịnso a wee bunye ngalaba ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ na steeti Anambra ọmarịcha ụgbọala nsọnyụ ọkụ ọhụụ abụọ, iji kwalite ọrụ na mpaghara ebe dị iche iche n’ime steeti ahụ.

  Mmemme ịnabàtà ụgbọala ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara aka na-achị steeti ahụ, b Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọ bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya.

  N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ kelèrè isi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ala Nigeria maka onyinye nkwàdo na mgbata ọsọ ahụ, bụkwa nke ọ gbara akaebe na ọ ga-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’ịkwàlite ọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ.

  O mèrè ka a mara na ọchịchị ya ga-aga n’ihu ịkwàdo ụlọọrụ ahụ na steeti ahụ iji hụ na e nwere ezi nchekwa ndụ na ngwongwo ụmụafọ steeti ahụ pụọ na mbíbì nke ọkụ ọgbụgba, ma gosipụtakwa olileanya o nwèrè na ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ ka ga-agakwa n’ihu na-enwetawanye úrù, enyemaka nà nkwàdo site n’aka isi ụlọọrụ ahụ ahụ.

  Ọ gakwazịrị n’ihu kwuo na a ga-edobe otu n’ime ụgbọala nsọnyụ ọkụ ahụ n’Ọnịtsha, ma dobe nke ọzọ n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

  Na mbụ n’okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Liman Alhaji Ibrahim, onye ọ bụ òsòtè ya bụ Maazị Calistus Agu nọchitere anya ya kọwara na nkwàdo ahụ ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ etiti na-enye ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ dị iche iche n’ala Nigeria site n’ibunye ha akụrụngwa e ji ebusò ọkụ ọgbụgba agha bụ nke nke dabàrà adabà ma bụrụkwa nke gbasòrò mkpebi ọchịchị onyesi ala Nigeria bụ Muhammadụ Buharị nwèrè ịhụ na e nwèrè ezi nchekwa ndụ na akụnụba n’ala Nigeria.

  Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti Anambra, bụ Maazị Ben Chiobi kèlèrè isi ụlọọrụ ahụ maka nkwàdo na onyinye ụgbọala ọhụụ abụọ ahụ.

  Oge ọ na-enye owuweanya na ụlọọrụ ya ga-etinye akụrụngwa ahụ n’ọrụ etu o siri kwesi ma jirikwa ya rụpụta ihe a hụrụ anya; Maazị Chiobi kwekwazịrị nkwá na ụlọọrụ ahụ ga-aga n’ihu ịrụ ọrụ ha etu o siri kwesi na steeti ahụ dịka o siri metụta ibu agha megide ajọ ọdachi ọkụ ọgbụgba na steeti ahụ.

  Oke mmemme ahụ bụ nke a nọrọ na ya nye Gọvanọ Obianọ onyinye nkwanye ùgwù maka ọrụ ọma ya n’ihe metụtara ibuso ọkụ ọgbụgba agha na steeti ahụ.

  Ya bụ mmemme dọtakwara ụfọdụ ndị ọzọ dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, nke gụnyere ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji enyere ndụ aka, bụ Maazị Emeka Ezenwanne, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here