A GA-ENWE emume oke ọńụ ụbọchị ụka a, ọnwa Septemba ga-adị n’abalị iri na atọ n’afọ a bụ 2020 dịka ezinaụlọ Dominic na Juliet Ifezue ga-ekubata ụmụejima ha bụ Chukwupuruimeihenile na Otitodirichukwu n’ụlọụka, ma tụọrọ Chineke mmamma, na St Mary’s Catholic Church, Awka.
Aja maasị dị asị ga-amalite na 9:45 nke ụtụtụ, ebe oriri na ọńụńụ ga-abụ n’ebe ezumezu ụlọụka ahụ (parish podium).
Ezinaụlọ ahụ jị obi ańụrị wee na-eto Chineke maka iji ejima nwoke na nwaanyị gozie ha ka ọ gachara afọ iri na iteghete ha lụrụ di na nwunye.