FLORENCE Samuel awụchaala n’ụlọikpe dị n’Osogbo, steeti Osun maka iti nwaanyị onye ọrụ uweojii bụ Sergeant Caroline Olaitan ihe.
Florence gbara afọ iri abụọ na asatọ, na-ere mmanya ọcha (palm wine) na shọọpụ dị na Balogun Agoro, Oshogbo, ka e kwuru na o tiri nwaanyị onye ọrụ uweojii ahụ ihe ma jụ ka ha nwụchikọọ ya dịka Caroline wụchara n’ọdụahịa ya n’ihi ebubo e boro ya na ego dị otu narị naịra na iri ise na-efu efu.
Onyeuweojii okwu dị n’aka (prosecutor), Adeoye Kayode, kọwara na Florence kparịrị Caroline site n’iti ya ihe ma dọkaa akwa uweojii ya (uniform) oge ọ bịara ịrụ ọrụ ya dịka onye uweojii.
Majie ji ikpe ahụ, Adebayo Ajala nabatara ka a kpọpụta ha (bail) n’ụlọnga n’ọnụ ego dị narị naịra anọ n’otu n’otu, tinyekwara ndị akaebe n’otu ọnụ ego ahụ.
Otu o sila dị, o bugharịrị ikpe ka ọ dịbazie na Oktoba 13, 2020.