OTU n’ime ndị dị ndụ ka otu ụlọ elu dara n’Asaba steeti Delta, Ike Ifeanacho akọwapụtala otu o siri gbanahụ ọnwụ n’otu ntabi anya na Satọdee gara aga oge ụlọelu a ka na-arụ arụ dara, bụ nke butere ọnwụ otu onye ebe mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ụzọ dị egwu.
Ifeanacho, kapịnta, kwuru na ya nọ ọrụ n’elu gbamgbam ụlọ ahụ oge ọ chọpụtara na ụlọ ahụ na-ada ada. O kwuru na ya amaghịzị ihe ọzọ ọ ga-eme karịa isi n’elụ ụlọ ahụ wụpụ, ma site na ya merụọ obere ahụ n’agba na ụkwụ ya.
Onye agbataobi nọ ka ya bụ ebelebe gburu, Friday James kwuru na ya nụrụ nnukwu ụda nke mere ka ya si na be ya gbapụta wee chọpụta na ọ bụ ụlọ dara; nke mere ka ya kpọkọọ ndị mmadụ ha jiri shọvelu bido gwube ihe ozugbo iji zọpụta ndị ụlọ dakwasara.
O kwuputara na mmadụ anọ, tinyere onye nwe ụlọ ahụ ka a zọpụtara n’ime ikpo ụlọ ahụ dara ada ebe e buputara otu onye n’ozu.
James kọwara na ndịagbataobi nuputara ma jiri aka nkịtị na shọvelu na-azọ mmadụ tupu ndị otu abụo ọ bụ ọrụ ha (excavators) abịa.
Ụlọ ahụ dara ada nke dị na Holy Mary Road, n’azụ Nigeria Police Officers Mess, Okwe, Asaba, ka e kwuru na a na-arụgharị ya ka ọ bụrụzie ụlọelu otu okpukpu n’ihi na ọ bụbu ọdụ ụgbọala (car park). A rụrụ ọrụ ahụ abalị anọ ma ọ dara dịka a na-akụ ya gbamgbam.
Onye nwe ụlọ ahụ, Sam Akaraiwe gbara afọ iri asaa na isii ma bụrụ onye ọrụ agha lara ezumike ka e kwuru na ọ bụ ya ji aka ya eleta ma na-ahụ ka ọrụ sị aga (supervision).
Akaraiwe, onye nwetara mmerụ ahụ n’isi ka e kwuru na a bọpụtara ya site n’ekwentị ya nọ na-akụ akụ n’ime ikpo ụlọ ahụ dara ada.
Onyeisioche okpuru ọchịchị Oshimili South, Uche Osadabe onye nke bịara ebe ahụ kwuru na ihe butere ọghọm ahụ bụ ejighị ihe dị mma arụ ọrụ, tinyere onye nwe ụlọ iji aka ya eleta ọrụ.
Osadebe kwukwara na ụlọ ahụ enweghị nkwado site n’aka ndị gọọmenti, ọ dị n’aka.