Gọọmenti Delta enyela ndịnkuzi 41 ntaramahụhụ maka igwu ojoro n’ule WASSCE

0
72
Okowa

GỌỌMENTỊ steeti Delta enyela ndịnkuzi iri anọ na otu ntaramahụhụ maka igwu ojoro n’ule 2019 West African Senior School Certificate Examination (WASSCE).

  A ga-egbochi ha inwe mbuli elu n’ọkwa n’ime otu afọ ma gbochikwaa ha iso lekọta (supervision) ule akwụkwọ ọbụla n’ime afọ atọ.

  Mkpebi ndị ahụ bụ ndị e nwetara site na ntụziaka ndị na-ahụ maka ule na steeti ahụ, Examination Ethics Disciplinary Committee, ma bụrụ nke kọmishọna mmụta, Commissioner for Basic and Secondary Education, na steeti ahụ Maazị Patrick Ubah nyere nkwado ya.

  Dịka e nyere ndịnkụzi ahụ gwuru ojoro ntaramahụhụ, a ga-enye otu onyenkụzi, Maazị P.O Okolo leta maka ime nke ọma (Letter of Commendation) maka ọrụ ọma ya n’ule ahụ.

  N’otu aka ahụkwa, a ga-enye ndịisi ụlọakwụkwọ na ndị na-ahụ maka ule n’ụlọakwụkwọ gọọmenti iri na atọ na otu ụlọakwụkwọ nke onwe (private school) bụ ebe ndị a hụtara igwu ojoro ule leta ịdọ aka na ntị site n’aka PPEB.

  A ga-enyekwa Anointed Secondary School, Ubogo, n’okpuru ọchịchị Udi bụ nke e mechiri n’afọ gara aga maka igwu ojoro n’ule, leta ịdọ aka na ntị ma hapụzie ha ka ha bidokwa akwụkwọ, iji nyekwa ha ohere ịgbaso iwu na-achị ule akwụkwọ.

  Otu o sila dị, a dara Mary Mount College, Boji-Boji Owa nha otu narị naịra maka igwu ojoro n’ule, iji mee ka ndị ọzọ mụrụ akọ.

GUO:  Ndị uweojii akpụgharịala ndịnkuzi iri na asaa maka igwu ojoro n'ule

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here