Ụkọchukwu katọlik eturula ugo dịka ọkaikpe ukwu na Ghana

0
69
Owusu-Agymang

OTU n’ime ndịọkaikpe ukwu (High Court Judge) iri na isii nke onyeisiala mba Ghana Akufo-Addo guzobere n’izuụka gara aga bụ ụkọchukwu katọlik.

  Rev Fr. Joseph Audu Owusu-Agyemang atọọla ntọala na Ghana site n’ịbụ ụkọchukwu izizi bụ onyeọkaikpe ukwu.

  Ọ bụ eziokwu na e nwere ndị okpe ikpe (lawyers) bụ ụkọchukwu na mba Ghana ma o nwebeghị onye n’ime ha bụ ọkaikpe ukwu. Fr Joseph Adu Owusu-Agymang bụ ụkọchukwu parish nke All Saints Catholic Church, Santasi Fankyenebra na Achịdayọsis Kumasi.

  Achịbisọpụ Peter Akwasi Sarpong chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa Julaị dị n’abalị iri na anọ, n’afọ 2007. Tutuu ruo n’ọkwa ọhụrụ a e nyere ya, ọ na-arụ ọrụ na ngalaba na-ahụ banyere ikpe na Archịdayọsis ahụ.

  Ya na mmadụ iri na ise ndị ọzọ ka onyeisiala ahụ, Akufo Addo duru n’iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe ukwu na mba ahụ. Ọ kpọkuru ha ka ha mata ọrụ dịịrị ha dịka ndị ọkaikpe ukwu ma dọọ ha aka na ntị ka ha jidesie eziokwu, mgbazi na mkwudosi ike n’ọrụ ha ka ndị Ghana wee nwee ntụkwasa obi n’ihe gbasara ikpe (judiciary).

  N’ikpeazụ, o kelere ha maka ugo nke ha tuuru.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here