Ajunwa akwaala arịrị na onwebeghị onye Nigeria sotere nzọ ụkwụ ya

0
81
Ajunwa

CHIOMA Ajunwa, bụ nwaanyị Nigeria tutere ugo n’oge gara aga dịka Olympic Gold Medalist egosipụtala mwute ya n’ihi na onwebeghị onye Nigeria gbara ọsọ ka ya onwe ya maọbụ karịa ya.

  Ajunwa, onye a maara dịka otu n’ime ọka ibe e nwere n’ala anyị n’ihe gbasara egwuregwu, ọ kachasị n’ịgba ọsọ kwuputara nke ahụ n’izuụka gara aga.

  O kwuru sị; “Obi adịghị m mma ugbu a’ihi na o nwebeghị onye ruru ogogo ahụ kemgbe ọtụtụ afọ.”

  Ajunwa bụ onye Nigeria izizi na-agba ọsọ tutere ugo ‘Olympic Gold Medal’ n’egwuregwu ‘summer olympics’ nke e mere n’Atlanta n’afọ 1996. Site oge ahụ ruo taa, sọ ya bụ onye tuterela ugo dịka ‘Nigeria Independent Olympic Medalist.’

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here