Okonjo-Iweala eturula ugo dịka nwaanyị izizi bụ onyeisi WTO

0
53

NWAANYỊ jibu ọkwa dịka minista na-ahụ maka ego (Finance Minister) ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka onyeisi ọba ego mba ụwa (MD World Bank) bụ Dọkịnta Ngozi Okonjo-Iweala eturula ugo dịka nwaanyị izizi bụ onyeisi (Director General) World Trade Organization (WTO).


Okonjo-Iweala jidere agụ na ndụ site ịbụ onye Africa izizi na nwaanyị izizi bụ onyeisi WTO dịka ọ gbara onye nke mbụ ka a sọchara mpi dị egwu na njem ahụ, nke mere ka a mara mbe n’abọ nke bụ oke.


Ya bụ oke nhọpụta onyeisi WTO bụ nnọọ nke dị egwu n’etiti nwa afọ Nigeria bụ Okonjo-Iweala na onye South Korea bụ ‘Trade Minister’ ha Yoo Myung-hee.


E kwuru na ya bụ ihe mere ka mba dị iche iche gụnyere United States (US), European Union (EU) nations, China, Japan na mba ndị ọzọ (BRICS Countries) tiwaa abụọ n’ịhọpụta onye ga-edu WTO.


Okonjo-Iweala gbara afọ iri isii na isii arụọla ọrụ dịka nwaanyị izizi na Nigeria bụ minista na-ahụ maka ego ma mechaa bụrụ minista maka mba ọzọ (Foreign Minister), onyeisi ọba ego mba ụwa tinyere ngalaba dị iche iche ọ kpara ike dị egwu.


N’ezie, odogwu nwaanyị a bụ Ngozi Okonjo-Iweala ataala akị nke a hụrụ ichere ya. O so na ndị mmiri agaghị amachi nzọ ụkwụ ha zọrọ n’ala anyị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here