CHUKWUEMEKA Morocco Maduka bụ ochie dike n’iti egwu. Onwụ ya bụ nnukwu ihe nwute n’ebe ndị Igbo, tinyere ala Nigeria gbaa gburugburu nọ. Odogwu nwoke a bụ a kwaa akwụrụ n’egwu ekpiri (highlife) bidoro iti egwu na nwata mgbe ọ dị afọ iri na abụọ.
Tupu ọnwụ ya ka ọnwa Oktoba dị n’abalị iri abụọ na iteghete n’afọ a bụ 2020, e kwuru na ọ bụ ya bụkarichara okenye na ndị niile na-eti egwu na mpaghara ‘South East’.
Ọ bụ eziokwu na nna ya enyeghị ya nkwado na njem iti egwu ya, ma otu o sila dị aha ya dara ụda n’ụdị egwu Igbo pụrụ iche ọ na-eti, egwu ifo ụdị nke a maara dịka egwu ekpiri.
Ọ bụghị sọọsọ na ọ kwalitere ma gbasaa egwu ekpiri kama o buru ya gaa mba ụwa dị iche iche, ndị gụnyere United States, United Kingdom, South Africa, China, Malaysia, Cameroon na Ghana.
Maduka gbara afọ iri asaa na isii tupu ọ laa mmụọ. Ọ bụ onye Ukwulu nke dị n’okpuru ọchịchị Dunukofia na steeti Anambra. Afọ a bụ afọ iri isii (60th anniversary) ọ malitere iti egwu.
Egwu ya gụnyere: Ojemba Enwe Ilo, Echi Dị Ime, Money Palaver, Igbo Star, Akalaka, Cheta Echi w.g.z.