ALA Igbo nwere ụdị ofe ha na-esiri nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ. Ofe ahụ na-enye aka ekpocha ahụ nwaanyị ahụ maka na ụda a na-etinye n’ofe ahụ bụ ọgwụ.
Ihe ndị a ka e ji esi ofe ahụ: ụda, mkpụrụ ụzịza kpọrọ nkụ, ose mkpọ, okpenyị, ịra, azụ ọkpọnkụ maọbụ anụ a miri amị, akwụkwọ ụtazị na okporoko. A dịghị etinye mmanụ n’ofe ahụ.
Otu a ka ị ga-esi sie ya: suo ụda ahụ nke ọma, tinye obere mmiri wee gbarie ya, were nyọ yọọ ya. Suo mkpụrụ ụzịza debe, ị gbanye mmiri ị ga-e ji sie ofe, I tinye okporoko, o ghee ị wụnye ụda, ụzịza, ọ gaa nkeji iri abụọ ị wụnye ịra, okpenyị, azụ, ose, nnu, magị; ị ga e ji obere ji rọọ ya, o ghee ị wụnye akwụkwọ ụtazị i bere kịrịkịrị. Ọ gaa nkeji ise, ị fọtuo ya. Ị were ezigbo nri ji a sụrụ nke ọma wee ribe ya.
Nwaanyị ahụ pụta n’ọnwa atọ, ị na-ajụ ya ma ọ gara obodo oyibo.