ỤBỌCHỊ ụka gara aga ọnwa Novemba dị n’abalị iri abụọ na abụọ ka ndị ụka Katọlik n’ụwa niile mere emume Kristi bụ eze. Ọ bụ nnukwu emume ome n’afọ nke ndị ụka Katọlik na-apụta n’igwe buru sakaramentị dị ngozị (Blessed Sacrament) kpagharịa n’ime ịgba egwu na ị bụrụ Chineke abụ otito.
Na dayọsịs Awka, Bishop Paulinus Ezeokafor nyere ntụziaka ka e mee ya na parish; nke pụtara na parishi ọbụla mere emume ahụ n’onwe ha, n’iche iche n’ihi ọnọdụ ụwa nọ na ya ugbu a maka ihe iche aka mgba nke ọrịa korona. Ọ bụrụ oge mbụ, parishi niile dị n’Awka na-abịakọta n’obi Chukwu St Patrik Cathedral, Awka, mekọta ya ọnụ.
Otu o sila dị, nnukwu emume ahụ n’agbanyeghị na e mere ya iche iche dara ụda n’ebe ọ dị ukwuu. Ndị mmadụ nuputara mee ngagharị dị ka o kwesịrị.
Ka Ọ Dị Taa sonyeere ndị ụlọụka St Thomas Aquinas Parish, GRA Awka. Ụkọchukwu parish bụ Fr Francis Oranye, tinyere Fr Blaise Ejike, Fr Rowland Victor Okoli, Fr Emmanuel Udu na ndị ọzọ tinyere ndị sista na ndị ụka niile malitere jiri abụ otito gawa ngagharị ahụ ozugbo ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke etiti ehihie.
Ha ji ibuli aha Chineke elu wee gagharịa n’okporoụzọ dị iche iche wee mechaa laghachị n’ụlọụka ahụ ebe ha jiri ụka Ngozi (benediction) were mechie ya.
N’okwu ya, ụkọchukwu parish, Fr Francis Oranye kọwara emiume ahụ dịka nnukwu emume na-eme ka okwukwe siwanye ike ma na-emekwa ka ndị mmadụ mata maka Dinwenu Jesu Kristi, onye ọ rụtụrụ aka na o nyere anyị ndụ, nwụọ n’elu obe, iji gbapụta anyị na njọ ka anyị were ruo eluigwe.
Fr Blaise Ejike na nkọwa o nyere banyere emume ahụ kwuru si na ọ bụ ụbọchị e ji egosi ụwa na Jesus bụ eze. Ọ kọwara na ọ dị ụzọ emume abụọ e mere; emume ahụ Dinwenu (Copus Kristi) nke e kwesịrị ime n’ọnwa Juunu ma bụrụ nke e bugharịrị ma bute ya n’oge emume Kristi bụ Eze n’ihi na ọ na-adanye n’oge uchu mmiri.
O kwuru sị na ọ na-echetara mmadụ mkpa ọ dị i sekpuru Dinwenu na Sakramentị dị Ngọzị n’ihi na ọ nọ n’me ya. O kelekwara Chineke maka iwere ọnọdụ na mmemme ahụ.
Sir Chuka Nnabuife, bụ onye agha nke ụka (knight of the church) ma bụrụ onye ji ọkwa dịka onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka kọwara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị ndị ụka Katọlik ji agwa ụwa onye ha na-eso.
O kwuru sị: “Ọ bụ ụbọchị anyị ji eto Christ n’ihu ọha na eze, ụbọchị ịgbasa oziọma. Anyị na-aga na-akpọlite ndị n’adịghị ọkụ nke ha ji adị oyi n’ihe gbasara Christ. Maka anyị bụ ndị Aquinas, Blessed Sakarament si ụzọ o sibeghị gaa na mbụ taa, o wee bụrụkwa uru.N’oge mbụ, ọ na-esi ụzọ St Patrick’s Cathedral. Taa eji m obi ańụrị agwa Christ, enye m gị onwe m, were m mee ihe dị gị mma.”
N’akụkụ nke ya, Sir J.A Ezeuchu bụ onye agha nke ụka ma bụrụkwa onye osote ụkọchukwu na kọmiti Aquinas Parish kwuru sị: “Obi bụ m sọ ańụrị. Taa bụ ụbọchị anyị jị echeta n’ụzọ pụrụ iche na Jesus bụ eze. Ọ bụ ụbọchị anyị ji egosi ụwa ihe anyị kwenyere.”
Ihe pụrụ iche e mere n’emume ahụ bụ: ịgba egwu ọdịnala, ịma mbem, ịgha okooko, ịgbara Jesus mkpọnala w.d.g.