EMUME akwamozu nke Ezinne Oriakụ Bernadette Lolo Ezeoke (Ada be Uzoadazie) onye e ji Nwanyị Makarịa wee mara ga-abụ echi, Fraịdee ọnwa Disemba ga-adị n’abalị iri na asatọ, afọ a bụ 2020.
Ozi si n’aka diọkpara ya bụ Dọkịnta Cole Ezeoke kwuru sị na akwamozu ya ga-amalite taa bụ Tọzdee abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba dịka a ga-akara ya aja maasị nche abalị nke ga-amalite n’elekere ise nke mgbede.
Aja maasị onye nwụrụ anwụ ga-abụzị na Fraidee abalị iri na asatọ, ọ ga-amalite n’elekere iri nke ụtụtụ. Ebe ụka ndị a ga-adị bụ n’ezinaụlọ Ezeoke, Umugama Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.
Emume akwamozi ya ga na-aga n’ihu ruo Satọdee abalị iri na iteghete, ebe ndị ọgọ, enyi na ikwu na ibe ga na-abịa na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ dịka o kwesịrị.
Aja maasị ịtụrụ Chineke mmamma ga-adị ụbọchị ụka abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba n’ụlọụka Holy Name Catholic Church, Umuchu.
Ezinne Bernadette Lolo Ezeoke bụ onye ụka Katọlik maara ihe ekwe na-akụ, onye ndu ụmụnwaanyị na onye na-enye ezi ntụziaka. Ọ tụnyere ụtụ dị egwu maka mmepe obodo ya bụ Umugama Umuchu.
Ọ hapụrụ ọtụtụ ụmụ ka ha rube ụjụ ọnwụ ya, ndị nke gụnyere: Dọkịnta Cole Ezeoke, Ọchịagha Dọkịnta M.C Ezeoke, Fada Tony Ezeoke, Oriakụ Jane Onyechi, ụmụ ụmụ, ụmụ ụmụ ụmụ na imirikiti ikwu na ibe.
Ọ gbara afọ iri iteghete na otu tupu ọ laa mmụọ.