OTU jikọtara ndị na-ede akwụkwọ, Association of Nigerian Authors (ANA); (otu mpaghara ya) mere emume zuzugbe ome n’afọ ha, agba nke iri atọ na iteghete n’Awka isiobodo steeti Anambra n’izuụka gara aga; nke were ọtụtụ ụbọchị.
Ha nọ n’ọgbakọ ahụ nke kpọkọtara ọtụtụ ndị otu ahụ sitere na steeti dị iche hazie ma lebaa anya n’ọtụtụ isi okwu.
Onyeisioche mmemme ụbọchị Fraidee ọnwa Disemba dị n’abalị iri na otu bụ Barr G. N. Orji nabatara ndị mmadụ niile si mpaghara Nigeria dị iche iche wee bịa ma too onye hibere emume ahụ bụ Ọkammụta Ngozi Chinwude dịka onye gbasiri ike na-eme ka ihe na-aga aga.
Oriakụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano (Osodieme) onye nke Oriakụ Chioma Unachukwu nọchitere anya ya nyere ndị otu ahụ nkwado ya.
N’okwu ya, Chioma Unachukwu gwara ndị abụghị ndị Igbo sị na Osideme pụtara nwaanyị na-eso di ya eme ihe dị mma ma kọwaara ọha na eze na a maara Oriakụ Obiano maka ọrụ ọma ya, tinyere na o nwere ihe ọ hibere (NGO) nke ọ na-esi na ya enyere ụmụ ogbenye aka. Ọ gwara ha sị: “N’aha Oriakụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano ana m anabata ụnụ bụ ndị si n’akụkụ ala Nigeria dị iche iche. Dịka ụnụ bịara Anambra, ụnụ ga-enwe ọńụ n’ihi na a maara anyị maka ịnabata ndị ọbịa. Steeti Anambra bụ ihe (light) obodo anyị. Oriakụ Obiano ziteere ụnụ ozi obi ọma.”
Ka o kwuchara okwu, o mepere emume ahụ.
N’adreesi nnabata, onyeisi ANA bụ Ahmed Maiwada kelere ọha na eze otu ha siri rụọ ahụ ha ụka bịa ọgbakọ ahụ tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma kwuputa maka ndị odee dịka Chinua Achebe, J.P Clark.
Ogiga Akuyada onye si Niger Delta University nọ na adressi (key note address) kọwapụta nka dị n’edemede ma gbaa akwụkwọ Achebe n’anwụ, tinyere ihe ndị ọzọ.
Onyeisioche emume ahụ bụ G.N Orji gara n’ihu dụọ ha ọdụ ka ha leruo anya ma hụ na e nwere udo n’otu ha bụ ANA iji mee ka ala anyị bụ Nigeria na-aga n’ihu n’ihi na mgbe enyi abụọ na-alụ ọgụ ọ bụ ahịhịa dị n’ala na-ata ahụhụ.
Jonathan Mangbon si steeti Taraba bịa kelere Chineke maka ọgbakọ ahụ ma kwuo na ọ gara nke ọma dịka o nwere olile anya na ihe ga-agbanwe. N’akụkụ nke ya, Abiodun Oloyede si steeti Osun kwuru sị: “Emume a bụ ome n’afọ. Ọ dị mma na anyị bịara obodo a bụ Anambra, obodo Achebe.”
Ihe pụrụ iche e mere n’emume ahụ gụnyere Aquila Theather Group ndị mere ejije, egwu w.d.g.